You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enwere mba nwereike ịwakpo mba ọzọ etu Amerịka si wakpoo mba Venezuela?
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Kemgbe mba Amerịka wakporo mba Venezuela ma kpụrụ onyeisiala ha na nwunye, e nweela ọtụtụ echiche si n'ebe dị iche iche banyere mwakpo ahụ nakwa ihe o nwereike ibute n'ọdịnihu.
Cheta na Onyeisiala Donald Trump kwuru na Amerịka wakporo mba Venezuela n'abalị Satọde 3 Jenụwarị, 2026 ma kpụrụ Onyeisiala ha bụ Nicolás Maduro na nwunye ya.
Onyeisiala Trump kọwara ogbunigwe ha tụrụ na mba Venezuela dịka "nnukwu mwakpo".
Dịka Trump si kwuo n'akara Truth soshal mịdịa ya "mba Amerịka emeela nnukwu mwakpo na mba Venezuela, ma kpụrụ Onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro na nwunye ya".
Mba Amerịka gakwara n'ihu kpụpụ Nicolás Maduro n'ụlọikpe maka ebubo ịtụ mgbere ọgwụike nakwa mpụ ndị ọzọ.
Gịnị mere Amerịka ji wakpo Venezuela?
Nke bụ eziokwu bụ na mba Amerịka ebola Nicolás Maduro ebubo dị iche iche nke gụnyere ịtụ mgbere ndị omekome mana ọ gọnarịrị ebubo a. Amerịka kwuru na otu 'Cartel de los Soles' bụ otu na-eyi ọha egwu ma bụrụ ndị na-akpa mkpamkpa gụnyere ịtụ mgbere ọgwụike nakwa igwupụta ihe ọnatarachi na nzuzo.
Ọzọ dị ka ibe ya bụ na e bola ọchịchị Maduro ebubo imetọ ikike ndị mba Venezuela.
N'afọ 2020, ndị nnyocha otu United Nations kwuru na gọọmenti Venezuela akpaala ajọ agwa dị iche iche nke gụnyere ogbugbu, imetọ ahụ, mkpagbu nakwa ofufu ndị mmadụ nke e kwuru na aka Maduro na ndịisi ọchịchị dị na ya
Otu ndị ọzọ na-chekwa ikike ndị mmadụ kwuru na ha chọpụtara ọtụtụ ndị gọọmenti tụrụ mkpọrọ nakwa ndị ngagharịiwe a tụrụ mkpọrọ.
Ọ bụ ihe ndị a mere ka ụfọdụ ndị mba Venezuela n'ebe niile ji chọọ ka Maduro pụọ n'ọchịchị n'agbanyeghị na o nwere ọtụtụ ndị nkwadu na-erubere ya isi.
Mba Amerịka emebeghị ụdịrị mwakpo dị etu a na mpaghara Latịn Amerịka kemgbe afọ 199 oge ha wakporo Panama iji wepụ onye bụbụ onyeisi ọchịchị ndịagha bụ Manuel Noriega. Mana ihe dị iche ugbua bụ na Amerịka boro Maduro ebubo ịtụ mgbere ọgwụike na ime mpụ ndị ọzọ.
Ụfọdụ ndị nkwado ọchịchị mba Amerịka na-eto etu e si wepụ Maduro n'ọkwa ma kwuo na ọ bụ naanị etu a bụ ụzọ nwereike iwepụ ya n'ọchịchị.
Ihe kpatara nke a bụ maka na obi ọchịchị Amerịka anaghị ahụta Maduro dịka Onyeisiala mba Venezuela kemgbe ntuliaka e mere na 2024 na mba ahụ. Akụkọ kwuru na pati chọrọ inwere ọchịchị wepụtara mpụtara ntuliaka ahụ nke gosiri na ọ bụghị Maduro meriri ntuliaka ahụ.
Ndị na-enyocha etu e si eme ntuliaka kwuru na ntuliaka kwuru na emeghị ntuliaka ahụ n'ụzọ iwu kwadoro ma kwuo na e nwere ọtụtụ nrụrụaka na ya.
Ha kwukwara na e gbochiri onyeisi ndị chọrọ inwere ọchịchị bụ Mari Corina Machado ịzọ ọkwa na ntuliaka ahụ.
Mana mba Venezuela boro ebubo na ọ bụ mmanụ agbidi ha nke bụ nke kachasị n'ụwa niile, ka Amerịka chọrọ izuru site na mwakpo. Ha kwuru na mmachi Amerịka machiri ụgbọmmiri abụọ bu mmanụ agbidi na mpaghara ha, gosiri na ebubo ha bụ eziokwu.
Gịnị ka iwu otu UN kwuru maka mba ịwakpo mba?
Iwu 'charter' otu United Nations mere ka o doo anya na mba ọbụla enweghị ikike ịwakpo mba ọzọ n'ike.
Ha kwuru na naanị oge mba ọbụla nwereike ịwakpo mba ọzọ bụ iji chekwaa onwe ya ma ọ bụrụ na ndịagha mere mwakpo na mba ha.
Ọ bụ n'ihi nke a ka otu UN jiri kwuo ma katọọ mwakpo ahụ Amerịka wakporo Venezuela maka na enweghị ihe ọbụla gosiri na Venezuela wakporo maọbụ na-akwado ịwakpo Amerịka.
Ọgbakọ ngalaba nchekwa otu UN kwuru na mwakpo ahụ bụ arụ ma kwuo na mba Amerịka emeteghị ya.
Mana Onyeisiala Donald Trump ekwuola na enweghị ihe gbasara ya gbasa imebi iwu mbaụwa ma kwuo na ihe bụ mkpa ya bụ igbochi ndị ọchịchị nchịgbu n'ụwa niile gbaa gburugburu.
Oge ya na ndị ntaakụkọ New York Times nwere mkparịtaụka, Onyeisiala Trump kwuru nay a na-erubeisi nye iwu mbaụwa mana ọ bụrụ iwu ahụ na-emegide ikike ndị mmadụ, Trump nay a agaghị agba nkịtị.
Akụkọ na-ekwu na Trump ekwuputala atụmatụ iwepụ mba Amerịka n'out UN nakwa out mbaụwa 66 ndị ọzọ.
Kedụ ihe otu Africa Union tinyekwara ọnụ n'okwu a?
N'aka nke ọzọ, otu African Union katọkwara mwakpo ahụ Amerịka wakporo Venezuela.
Akwụkwọ ozi otu AU wepụtara mere ka o doo anya na mwakpo ahụ nwereike itinye ọgbaaghara na mpaghara Latịn Amerịka ma metụta udo n'ụwa niile.
AU kwuru na ha kwenyere n'irube isi nye iwu Charter otu UN nke megidere mba ọbụla ịwakpo ibe ya nakwa ịkwanye ugwu nye mba ọbụla.
Otu AU kwuru na ọ dịmma ka e nwee mkparịtaụka ma weta udo na Venezuela tupu a malite inwe nsogbu obodo maka ya.
Mba ụfọdụ katọrọ mwakpo ahụ mba Amerịka mere
Ọtụtụ mba dị iche iche katọrọ mwakpo ahụ mba Amerịka mere na mba Venezuela ma kpụrụ onyeisiala na nwunye ya.
Mba ndị ahụ gụnyere Brazịl, China, Chile, Kolombịa, Meziko, Urugua nakwa Spen boro mba Amerịka ebubo ịtọ ajọ ntọala nwereike imetụta udo mbaụwa nakwa ọnọdụ nchekwa.
Mba ndị a kwuru na ha chọrọ ka e nweta ezi udo zuruoke na mba Venezuela site na-ine mkparịtaụka na ịtụ alo.
Ha mekwara ka o doo anya na ha agaghị akwado agwa ọbụla megidere iwu mbaụwa nke nwereike ibute ọgbaaghara na mpaghara Saụt Amerịka niile.
Mba ndị ọzọ katọkwara mwakpo bụ UK.