Nsogbu dara n'ụlọomeiwu Sịneti mgbe a kwụsịrị Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ịbata

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Nsogbu dara ebe niile mgbe ndị ọrụ nchekwa kwụsịrị Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ịbanye n'ụlọ ndị omeiwu Sịneti n'Abuja, isi obodo Naịjirịa.

Cheta na ụlọikpe nyere iwu ma gwa ndị sịneti ka ha nabata Sịnetọ Natasha na-anọchịta anya ndị Kogi Central n'ụlọomeiwu Sịneti ma nye ya ohere ka ọ bido ọrụ ya dịka onye omeiwu.

Mgbe Natasha rutere nso n'ogige Sịnetị ka ndị ọru nchekwa kwụsịrị ya nakwa ndị ọzọ sonyere ya dịka Aisha Yesufu ma jụ na ha agaghị abanye n'ime ụlọ sịneti.

Ọ bụ mgbe Natasha na ndị ahụ so ya jiri ụkwụ ka ha banye ka ndị ọrụ nchekwa ọzọ bịakwara nọchie ha ụzọ ma sị ya laghachị azụ nke kpatara nsogbu jiri daa ebe niile.

Nkọwa Sịnetọ Natasha na Ọnụ ne-ekwuru Sịneti nyere maka ihe mere

Sịnetọ Natasha kọwara ihe mere dịka ihe ịta ụta ma kọwaa na ya gwara ndị Sịneti na ya na-ebido ọrụ site n'akwụkwọ ya degara ha ugboro abụọ.

O boro Godswill Akpabio ebubo sị na "ọ na-ada iwu".

Mana ndị Sịneti enwebeghị ihe ha kwuru karịa ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Yemi Adaramodu kesere ma sị na mkpebi ụlọikpe nyere na Julaị 5 2025 banyere Natasha ịbido ọrụ ya na Sịneti abụghị nke ụlọomeiwu ga-erube isi.

Ọ sị na ọ bụ ndụmọdụ ka ụlọikpe nyere ma kwuo na "sịneti nwereikeke ịkwete maọbụ hara ịkwete" ikpebi ụlọikpe nyere.

Cheta na Natasha Akpoti-Uduaghan ka sịneti kwụsịrị ọrụ kemgbe ọnwa isii maka ebubo ịda iwu na usoro Sịnetị.

Natasha kwuru na ebe a sị ya nọrọ oche na Sịneti adịghị mma ma kwuo na onyeisi Sịneti bụ Godswill Akpabio na-amaja ya amaja.

Natasha mechere boo Akpabio ebubo gbasara ịkpasa ya agwa ịkwa iko na ihe ndị ọzo ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Ọkaikpe Binta Nyako kpebiri ikpe kwuo na ị kwụsịtụ Natasha ọrụ ọnwa isii bụ ntarama ahụhụ karịrị akarị ma gafee ihe o kwesiri ịbụ.

Ụlọikpe agwala Sineti ka ha kpọghachita Natasha Akpoti-Uduaghan dịka Sinetọ

Ụlọikpe enyela iwu ka ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa kpọghachita Natasha Akpoti-Uduaghan ka ọ malite ọrụ ya dịka Sinetọ na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu Sineti.

Ọkaikpe Binta Nyakọ nke ụlọikpe Ukwu gọọmenti etiti dị n'Abuja, nyere mkpebi a ụbọchị Fraịde 4 Julaị, 2025 ma kwuo na mmachi ọnwa isii ahụ ụlọomeiwu Sineti machiri Natasha Akpoti megidere iwu.

Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ dịghị mma ka mpaghara ọbụla na Naịjirịa ghara inwe onye na-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu ma gwa ụlọomeiwu Sineti ka ha megharịa iwu ha banyere ịkwụsịtụ ndị omeiwu dara iwu ọrụ.

N'aka nke ọzọ, ụlọikpe ahụ kwuru na Sinetọ Natasha dara iwu ụlọikpe ahụ site n'ozi mgbaghara ahụ dị aghaa o depụtara n'akara Facebook ya.

Maka nke a, Ọkaikpe Nyako dara Natasha Akpoti nha nde naịra ise ọ ga-akwụ ụlọikpe ahụ.

Ụlọikpe nyekwara ya iwu ka o dee ozi arịrịọ zuruoke n'akara Facebook ya ma tinyekwa ya n'ụlọọrụ mgbasaozi 'newspaper' abụọ.

Ụlọikpe kwuru na ọ ga-eme nke n'ime ablaị asaa ụlọikpe nyere mkpebi ya.

Ụlọikpe eyigharịala ikpe Natasha Akpoti-Uduaghan maka ebubo nkwutọ Gọọmenti Naịjirịa boro ya

Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja enyela Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ntọhapụ beelụ n'ihi na ọ bụ onye a ma ama.

Ọnọdụ a na-abịa dịka onye omeiwu ahụ na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọ omeiwu sịnetị kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo isii Gọọmenti Naịjirịa boro ya.

Ọ bụ n'ihu Ọkaikpe Mohammed Umar nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja ka Gọọmenti Naịjirịa kpụpụrụ Natasha Akpoti-Uduaghan ma boo ya ebubo nkwutọ na nkatọ.

Ha sị na Akpoti-Uduaghan boro ebubo mpụ nwereike imebi aha Onyeisi ụlọ omeiwu sịnetị Naịjirịa bụ Godswill Akpabio na onye bụbu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello.

E tinyeziri ikpe ahụ n'ụbọchị 22 Septemba 2025 maka ilebara ya anya.

Ụlọikpe enyeela Natasha Akpoti ntọhapụ beelu N50m maka ebubo ikwutọ Sinetọ Godswill Akpabio

Ọkaikpe Chizoba Orji nke ụlọikpe ukwu etiti n'Abụja enyeela Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchite anya mpaghara Kogi Central ntọhapụ beelu n'ọnụ ego nde narị iri ise (50m) na otu onye n'aka nwere ezi akparamagwa ma nwee ala n' Abụja.

Oge a kpọlitere ikpe ya ụbọchị Tọzde, 19 Juun, 2025, maka ebubo ikwutọ onyeisi ụlọomeiwu Sineti bụ Godswill Akpabio na Yahaya Bello bụbu Gọvanọ Kogi steeti, Natasha gwara ụlọikpe ahụ na ya ekwutoghị onye ọbụla.

Ndị bịara ikpe ahụ gụnyere di Natasha bụ Emmanuel Uduaghan, onye bụbu Minista na-ahụ maka agụmakwukwọ bụ Oby Ezekwesili, Aisha Yesufu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Natasha Akpoti-Uduaghan: Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ya n'ụlọikpe maka ebubo mpụ

Gọọmenti Naịjirịa agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe megide omeiwu na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu ukwu naịjirịa bụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan maka ebubo ikwu okwu nkwutọ n'ụlọmgbasaozi igwe onyooyo.

Akwụkwọ ahụ gọọmenti gbara n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụbọchị 16 Mee 2025 kpọrọ naanị aha Akpoti-Uduaghan dịka onye ga-azara ọnụ ya.

Gọọmenti rụtụrụ aka na mpaghara iwu 391 nke iwu 'penal code', CAP 89 nke iwu Naịjirịa afọ 1999, kwuo na Sịnetọ ahụ "boro ebubo ma marakwa na ụdị ebubo ahụ pụrụ imebi aha mmadụ."

Ha kwuru na omume ọjọọ ahụ nwere ntaramaahụhụ dịịrị ya na mpaghara 392 nke otu iwu ahụ.

Aha ndị akaebe e wepụtara gosiri na Onyeisi ụlọọmeiwu ukwu Naịjirịa bụ Sịnetọ Godswill Akpabio na onye bụbu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello ga-agba ama oge a ga-ekpe ikpe ahụ.

Otu n'ime ebubo ndị e boro Natasha Akpoti-Uduaghan gụnyere ibo Sịnetọ Godswill Akpabio na Yahaya Bello ebubo ime atụmatụ iwepụ ndụ ya.

Gọọmenti Naịjirịa bokwara ebubo na Sịnetọ ahụ boro Akpabio ebubo oge a gbara ya ajụjụ n'otu ihe omume a haziri n'ụlọmgbasaozi tivii.

Cheta na Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan nọọrọ n'oge mbụ boo ebubo na Onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa chọrọ ịwakpo ya n'ụzọ mmetọ mana Onyeisi ụlọmeiwu gọnarịrị ya bụ ebubo oge ahụ.

Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka, Sịnetọ Akpoti-Uduaghan sị na ọ bụ dịka o kwupụtachara mwakpo ọ sị na Onyeisi ụlọomeiwu chọrọ ime ya kpatara ha jiri kwụsịtụ ya ọrụ ruo ọnwa isii ma napụ ya ụgwọọnwa na ụfọdụ oke ndị ruuru ya dịka Sịnetọ.

Onye bụ Godswill Akpabio?

Lee ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma maka Godswill Akpabio:

  • Ọ bụ Onyeisi ụlọomeiwu ukwu na Naịjirịa
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị Federal Government college PọtHakọt
  • Akpabio gara Mahadum nke Calabar ebe ọ gụrụ maka iwu wee bụrụ Ọkaiwu.
  • O ji ọkọlọtọ PDP merie ma bụrụ Gọvanọ Akwa Ibom steeti site 2003 ruo 2015.
  • Ọ pụtara PDP gbaba APC n'afọ 2018
  • Aka chibụrụ Naịjirịa Onyeisiala Buhari họrọ ya dịka Minista nke Mmanụ
  • A họpụtara ya dịka Onyeisi ụlọomeiwu Ukwu n'afọ 2023.
  • Ọ kwụsịtụrụ Sinetọ Natasha ọrụ ruo ọnwa isii maka ebubo na ọ nupuru Sineti isi site na akparamaagwa ya.
  • Kamgbe ahụ ka ebubo si efegharị n'etiti ya bụ Sinetọ Akpabio na Sinetọ Natasha.

Natasha Akpoti-Uduaghan

Ihe anyị ma maka Sinetọ Natasha:

  • Nne ya bụ onye mba Ukren nna ya bụ onye Kogi steeti.
  • A mụrụ Natasha na Kwara steeti.
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ Sekọndịrị Federal Government College na Ondo Steeti.
  • Ọ zọbụrụ ọkwa gọvanọ n'afọ 2019 site n'iji ọkọlọtọ SDP.
  • O ji ọkọlọtọ PDP merie ọkwa Sinetọ n'afọ 2023.
  • Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan bụ onye nnọchiteanya ndị mpaghara Kogi Sentralụ Sinetorịal
  • N'ụlọomeiwu Sineti, ya na Onyeisi ụlọomeiwu nwetụrụ nghọtahie, o wee boo ya bụ Akpabio ebubo mmetọ tupu akwụsịtụ ya ọrụ nwa mgbe nta maka akparaagwa na-ezighi ezi.