Ọkaikpe Nyako ekwuola ụbọchị ọ ga-ekpe ikpe Sịnetọ Natasha na Akpabio

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja ekwupụtala 27 Juun dịka ụbọchị a ga-ekpe ikpe dị n'etiti Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Central na Onyeisi Sịnetị Naịjirịa bụ Godswill Akpabio.

Cheta na Sịnetọ Natasha gbara Onyeisi Sịnetị Naịjirịa bụ Godswill Akpabio akwụkwọ n'ụlọikpe maka ebubo ịkwụsịtụ ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ ọrụ.

Natasha na-arịọ ụlọikpe ka ha kpebie na usoro e siri kwụsị ya ọrụ megidere iwu Naịjirịa.

N'ụlọikpe ụbọchị Tuzde Mee 13, e nwere oke arụmụka maka usoro kwesịrị ekwesị a ga-anabata iji malite ikpe ahụ.

Oge ndị Ọkaiwu na-anọchite ndị niile aha ha nọ n'ikpe ahụ rụchara ụka, Ọkaikpe Nyako si na ọ ga-ebu ụzọ tụlee okwu nlelị na ihe mgbochi nile ndị Ọkaiwụ nyere tupu ya enye ikpe ya.

Sịnetọ Natasha awuchiela n'ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka ikpe ya na Sịnetọ Akpabio

Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ga-eleba anya n'ikpe dị n'etiti Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Centra dị na Kogi steeti.

Cheta na Sịnetọ Natasha gbara Onyeisi Sịnetị Naịjirịa bụ Godswill Akpabio akwụkwọ n'ụlọikpe maka ebubo ịkwụsịtụ ya na mmadụ abụọ ndị ọzụ ọrụ.

Natasha na-arịọ ụlọikpe ka ha kpebie na usoro e si kwụsị ya ọrụ megidere iwu Naịjirịa.

Ihe ụlọikpe ga-eleba anya

Ihe butere Sịnetọ Binta Nyako n'ụlọikpe n'ụbọchị bụ ịzara ọnụ ya n'ebubo ịmegịde iwu ụlọikpe.

Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nyere iwu ka Akpabio na Natasha hara ikwu okwu banyere ikpe ha dị n'ụlọikpe ya mana Sịnetọ Natasha nwere ihe ọ dere n'akara Facebook.

Ọkaiwu Sịnatọ Akpabio gwara ụlọikpe na ihe ahụ Natasha dere n'akara Facebook megidere iwu ụlọikpe bụ ihe butere ha n'ụlọikpe taa.

Gịnị ka Natasha dere nke butere okwu a?

N'abalị 27 nke ọnwa Eprelụ ka Sịnetọ Natasha jiri akara Facebook ya dee edemede isi okwu ya bụ " SATIRICAL APOLOGY LETTER" n'olu bekee.

Ọ bụ maka ihe o dere ka ọkaiwu Sịnetọ Akpabio gwara ụlọikpe na nke ahụ megidere iwu.

Maka ọkaiwu Natasha bụ Okutekpa na-ekwu na ihe ahụ o dere na Facebook enweghị ka o siri metụta okwu dị n'ụlọikpe.

Dịka Natasha si dee "ọ bụ n'ụta ka m ji na-arịọ ka ị gbaghara m maka mpụ ịchekwa onwe m n'ihu gị ma chekwa ugwu dịaara m".

"Echeela m echiche nke ọma tupuu m achọpụta na ị hụta Sịnetọ na-eme nke ọma bụ mmadụ ị kweta ihe ọbụla a gwara ya".

Ọkaikpe Binta Nyako ga-elebanye anya n'ikpe ahụ taa.