Nnamdi Kanu Arrested: Gọọmentị Naijiria anwụchiela Nnamdi Kanu

Jọstis Binta Nyako nke Ụlọikpe Abụja enyela iwu ka e jichie Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ Directorate of State Security - DSS wee ruo abalị 26 nke ọnwa Julai bụ oge a ga-akpụpụta ya n'ụlọikpe ọzọ.

Nke a na-abịa dịka ọkaiwu nọchitere Gọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Nnamdi Kanu, onyendu ndị otu Indegenous People of Biafra nke e jiri Ipob mara n'ịchafụ.

Gọọmentị Etiti nwuchiri Nnamdi Kanu maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ mba Biafra site na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọkaiwu Labaran, na-anọchitere ndị gọọmenti etiti kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017, ọ gbara ọsọ.

Goomenti anwụchiela Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).

Mịnịsta ikpe ma bụrụkwa ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami bụ onye gbara ama n'ehihie Tuzde n'oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka kwuru na a nwuchiri ya ụbọchị ụka (27/6/2021).

Malami kwuru na a nwụchiri Kanu ụbọchịụka ebe a ga-akpụpụ ya ụlọikpe maka ịgba mbọ ikewapụ na Naiijria.

Mana ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor gwara BBC Igbo n'ekwentị na dịka ọ dị n'iwu na "aka onye ọbụla dị ọcha rue ma ụlọikpe a mara ya ikpe."

N'otu aka ahụ, onye bubu minista ụgbọelu na Naịjirịa bụrụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Mbazuruike Amechi adọọla gọọmentị etiti aka na ntị ma sị ka "ihe emekwala ya kama ha kpụpụ ya ụlọikpe."

Cheta na Kanu gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike.

Etu Afaraukwu dị na mgbede taa bụ Tuzde (29/6/2021)

Dịka ọ na-ewu na soshal midia taa na Gọọmentị Etiti anwụchiela onyeisi otu ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu, BBC Igbo gara na na be nna ya n'Isiama Afara Ukwu, Abia steeti ịhụ ka ndị obodo ya si nabata ya bụ akụkọ.

Ebe niile dere jii oge onye ntaakụkọ anyị rutere ebe ahụ.

Ndị agbata obi ya gwara onye ntaakụkọ anyị na ha anụbeghị maka ya bụ nkwuchigharị.

Mana n'ọdọ ụgbọala dị n'obodo ahụ, ụfọdụ ndi mmadu kwụpụtara mwute ha n'okwu nnwuchigharị ahụ, ebe ụfọdụ kwuru na Nnamdi Kanu ga-enwe mmeri n'ụlọikpe.

Usoro ihe merela n'okwu Nnamdi Kanu na Gọọmenti etiti Naijiria

  • 18 Oktoba 2015: Gọọmentị Naijiria nwụchiri onyeisi ndị otu Ipob n'ụlọezumike, Golden Tulip Essential Hotel dị na mpaghara Ikeja, Legos
  • 19 Oktoba 2015: Ndị otu Ipob bidoro ngagharia iwe maka nnwuchi a nwuchịrị onye ndu ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa n'odịda
  • 19 Oktoba 2015: E nyere iwu ka agbapụta Nnamdi Kanu n'aka ndị uweojii nzuzo bụ DSS
  • 19 Novemba 2015: DSS kwuru na ha natara ikike ijide Nnamdi ruo onwa atọ
  • 23 Nọvemba 2015: Akpụtara Nnamdi Kanu n'ụlọịkpe n'okwu ibute ogbaghara n'ala Naijiria
  • 23 Nọvemba 2015: E highariri ikpe ya ruo Dịsemba 1, 2015
  • 17 Disemba, 2015: Ụlọikpe Ukwu nọ n'Abuja tiri iwu ka a tọpụ Nnamdi Kanu e ji eji
  • Septemba 2017: E bidoro chọkwa Nnamdi Kanu achọ
  • 10 Septemba, 2017: Ndị nsonazụ, nakwa ọnụ n'ekwuru ndi Ipob bụ Emma Powerful Nnamdi kwuru na ndị agha Naijiria na ndị uweojịị bakpụtere na be Nnamdi, gbuo ndị mmadu, meruo ndị ọzọ ahụ.
  • 10 Septemba 2017: O sotere ọnụ n'ekwuru ndị agha n'afo 2017 bụ Majọ Oyegoke Gbadamosi kwuru na ndị agha egbughị onye obula, o kwukwara na ha emerughi onye obula ahu
  • 22 Oktoba 2018: A hụrụ Nnamdi Kanu n'ihu ọha mbụ kemgbe a ji achọwa ya na mba Israel. Ihe nkiri bidoro fegharia na soshal midia ebe Nnamdi na-ekpe ekpere na mba ahu.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi Okwu Kanu bụ onye hibere ma bụrụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba nwere onwe ha a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

O kwenyere na ma bụrụ onye ofufe Judaism.