You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
N100m bounty on Nnamdi Kanu: Anyị ga-akwụ onye ọbụla kpụtara anyị Nnamdi Kanu N100m - Otu Ndị Ugwu
Otu Ohaneze agwala ndị Ugwu tinyere ego n'isi Nnamdi Kanu ka ha buru ụzọ chọọ ihe ha dara mmiri tupu ha chọwa nke onye ọzọ.
Nke a na-abịa dịka otu jịkọrọ otu ndị Ugwu kpọrọ onwe ha 'Northern Consensus Movement' ekpebiela n'Abuja ụbọchị Tozde inye onye ọbụla nyefere ha Nnamdi Kanu otu nari nde naira (N100m).
Mana otu Ohaneze Ndigbo si ndị Ugwu bụrụ ụzọ tinye ego n'isi ndị Boko Haram na ndị ọchịehi tupu ha e kwube okwu Nnamdi kanu maọbụ otu Ipob.
Ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnandị gwara BBC Igbo n'ekwentị sị, "O nweghị mgbe anyi ji kwenye na Nnamdi Kanu maọbụ ndị Ipob bụ ndị oyiegwu(terrorists)..
"Ndị bụ ndị ama dịka ndị oyiegwu bụ ndị Boko Haram na ndị Fulani Ochịehi, ọ bụrụ na o nwere ndị a ga-atụkwa sị ego n'isi ha, si bidogodu na ndị Boko Haram na ndị ọchịehi."
Ohaneze rụtụrụ aka na ihe butere ihe na-akpọtụ bụ mkpachapụ ndị Igbo.
Ha gara n'ihu kwuo ka Onyeisiala Muhammadu Buhari kpọ oku ka ya na ndị Igbo nwee mkparịtaụka ga-eweta udo.
"Onye ọbụla nọ na Naijiria ma na a na-emegide ndị Igbo. Otu ihe ka anyị na-arịọ Naijiria, ya kpọọ ndị be anyị ka anyị na ya kpaa nkata."
"Ọ bụ omume ọ na-emeso anyị kpatara ihe ndị a niile na-eme."
Onye nye anyị Nnamdi Kanu na ndụ, anyị ga-akwụ ya N100m - Otu ndị Ugwu
Otu 'Northern Consensus Movement' kwuru n' ụbọchị Tọzde n'Abuja na ha ekpebiela inye onye ọbụla kpọtara ha onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu otu narị nde Naira (N100m).
Otu ndị so na 'Northern Consensus Movement' gụnyere; otu 'Arewa Traders Association, 'Amalgamated Cattle Dealers Association of Nigeria', 'Tricycle Rider's And Owners Association', 'Gan Allah Association of Nigeria' wgz.
N'akwụkwọ ndị otu ahụ wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Awwal Abdullahi Aliyu binyere aka, ha sịrị " Anyị etinyela ego dị N100,000,000 maka onye ga-akọtalara otu Northewrn Consensus Movement
Nnamdi Kanu na ndụ na ahụike ka anyị nyefe ya ndị uweojii."
Ha gara n'ihu kpokuo mba Amerịka, Jamini nakwa Briten ka ha nye aka hụ na a kpọhachiri Kanu ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ike maka "ebubo iyi egwu na mgbuchapụ agbụrụ megide ndị Ugwu."
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Awwal Aliyu nwere n'ikuku, o kwuru na Kanu gbara ọzọ n'ikpe ya dị n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe maka ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị, ji 'okwu akpọmasị" akpalite ndị mmadu igbusịsị ndị Ugwu nọ n'Ọwụwa Anyanwu ma na-emebisị ngwahịa ha.
Senetọ Shehu Sani akatọọla ndi Ugwu tinyere ego n'isi Nnamdi Kanu
Senetọ Shehu Sani nọchiteburu Kaduna Central n'Ụlọomeiwu Ukwu agwala ndị Ugwu ibe ya ka ha buru ụzọ wepụ osisi dị ha n'anya tupu ha chọwa onye ha ga-ewepụ nke ya.
Sani kwuru nke a na akara Facebook ya dịka otu jịkọrọ ndị Ugwu kpọrọ onwe ha 'Northern Consensus Movement' kwuru na ha ga-etinye nari nde Naịra (N100) n'isi Nnamdi Kanu maka onye ọbụla ga-akpọta ya ka ọ zara ọnụ ya na Naijiria.
Sani sị, "anyị nwere ndị na-eyi ndụ egwu na ndị ekperima n'Ugwu bụ ndị na-egbu ma na-atọ ndị nke anyị, ndị otu ndị a etinyeghị ego n'isi ndị ndu ha, kama ha tinyere ego n'isi onye nọ n'ala Bekee."
Akụkọ ga-amasị gị: