You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ralph Uwazurike gwara United Nations na mkpu Biafra na-aga n'ihu n'ihi na mmegbu ndị Ọwụwa Anyanwụ
Onyeisi otu Biafra Independence Movement na Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra (BIM-MASSOB) agwaala otu United Nation ka ha gbapụ ya ọsọ mee ka Biafra nwereonwe ya.
O kwuru nke a n'ọgbakọ United Nation maka ọgbaghara na mgbochi ya a kpọrọ Regional Forum on conflict and the prevention in Africa and Middle East.
Ngalaba United Nation a kpọrọ 'Special Rapporteur on minority issues' nke ụlọọrụ Tom Lantos n'isi ya haziri ya.
Uwazuruike bụ onye nọchitereanya Biafra n'ọgbakọ a e mere n'ịntanetị, sị na ọgbaghara ịdị n'obodo na-akpagbu ikike dịịrị onye.
"Ikike dịrị onye na-adị ire ebe ọgbaghara na-adịghị, ọgbaghara dịrị onweghi onye ga-anụ ụtọ ikike dịrị onye".
Ọ sị na Biafra so n'agbụrụ ndị kachasị ukwuu mana ndị Fulani dị obere na-akpagbu ikike dịịrị ndị Biafra site na gọọmentị nọ n'ọchịchị.
Uwazuruike gwara United Nations ka ha lebanya ebe ndị ahụ agbụrụ dị obere na-akpagbu ndị nnukwu ma mee ha kwụrụ onwe ha.
"Ihe m na-asị United Nations bụ ka e nyee Biafra nwereonwe ka ha nwee ike ịketa oke n'ikike dịịrị onye dịka mba ndị ọzọ n'ụwa".
Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ọchịchị mwereonwe Biafra malitere kamgbe ihe dịka afọ 1967 n'ihi mmegbu Biafra nke mechara bute agha n'etiti Naịjirịa na Biafra.
Uwazuruike sị na kemgbe a lụchara agha ahụ rute ugbua na mmegbu ahụ ka na-aga n'ihu, na ọ bụ n'afọ 1990 ka ọ malitere ọchịchọ Biafra ọzọ n'ụzọ udo.
Ralph Uwazuruike sị na ọ nwuchiri Nnamdi Kanu mgbe ọ na-agbankwụ ma kpọchie ya abalị ise
Ralph Uwazurike bụ onyeisi otu Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (Massob) ekwuola na ọ kpọchiri Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) n'ụlọ ya ruo ụbọchị ise.
O kwuru nke a n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara Facebook na Mọnde 3 Mee, afọ 2021 bụ ebe ọ sị na Kanu zitere ndị Eastern Security Network ka ha bịa wakpoo ya.
O kwuru sị, " I zitere ndị otu ESN gị ka ha wakpoo m, cheta na gị nke ọma. Ị bụ onye ụjọ anọ m ebe a, enweghị ebe ọbụla m gbaa ọsọ aga".
Uwazuruike kwuru sị, cheta mgbe ị chọrọ ịgbankwụ nwunye gị, ị gwara nwanne gị nwaanyị bụ onye uweojii ka o were ndị uweojii pụrụiche gbaa gị gburu gburu, kama ndị m zitere bịara n'isi oche ebe ị nọ wee nwụrụ gị ma kpọta gị n'ihu m, e jichiri m gị ruo ụbọchị ise iji kuziere gị na m karịrị gị".
O kwuru na ọ bụ ya nyere Kanu ego dị puku narị anọ o ji gbaa nkwụ nwunye ya.
Ọ gara n'ihu kwuo, "Achọghị m igbu gị, achọro m ịgwa gị na ndị uweojii gbara gị gburugburu agaghị azọ gị".
Ọ tụrụ ilu sị, "ọ bụ nwaanyị bido shiwe nri na-enwe nkanka ite".
Uwazuruike sị na ya chọro ịgwa ndị Biafra na e nwere ndị Nnamdi Kanu na-arụrụ ọrụ.
O kwuru sị, "achọghị m iji egbe chọta Biafra".
Ọ gwara Nnamdi Kanu sị, "Mgbe ọbụla ị batara Naijirịa m ga-anwụchị gị, ọsọ kwa gị were ndị ESN gbaa onwe gị gburu gburu".
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakor, ọ jụrụ itinye ọnụ n'okwu ahụ a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: