You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kidney diseases: Etu ị ga-esi gbalahụ ọrịa akịrị
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Kemgbe ọ pụtara ihe na ọ bụ ọrịa akịrị gburu Mmesoma Obi, a ma dịka 'Ada Jesus' n'oge erughị eru, egwu ọrịa ahụ Bekee kpọrọ 'kidney disease' na-atụzi ọtụtụ ndị mmadụ.
Nke a bụ n'ihi na ọtụtụ na-ahụta ọrịa ahụ dịka 'ọnyịrịdịbịa'.
Ọrịa akịrị amaghị nwata maọbụ okenye; O gburu Ada Jesus n'afọ 2021 ka ọ dị naanị afọ 23, onye ejije Muna Obiekwe n'afọ 2015 ka ọ dị afọ 36.
O gbukwara Musa Yar'Adua bụbu onyeisiala n'afọ 2010 ọ dị afọ 58.
Otu WHO kwuru na otu nde mmadụ na ụma (1.2 million) nwụrụ n'ụwa n'afọ 2015 site n'ọrịa akịrị.
Ọtụtụ amaghị ihe na-ebute ya, nke ha na-ama ihe ndị ha nwere ike ime iji gbalahụ ya,ebe ụfọdụ na-ebo ya akaọrụ ndị iro ha.
Mana lee nkọwa Dọkịta Ifeoma Ulasi nke UNTH bụ ọkammụta akịrị Bekee kpọrọ 'nephrologist' nyere maka ya:
Gịnị bụdị ọrịa akịrị?
Ọrịa akịrị bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-ahụ maka iwepụ mammịrị na atịtị ndị ọzọ dị mmadụ n'ahụ.
Dkta Ulasi kọwara ọrịa akịrị: "Akịrị dị n'azụ ime afọ,ọ bụ akụkụ ahụ na-enyere anyị aka ka anyị nyụọ mammịrị.
Ọ na-ewepụ ihe ọbụla anyị riri ahụ anyị achọghịzị site ịzacha ọbara."
"O nwezie ka mmadụ si nwe ọrịa akịrị, ihe nile onye ahụ riri adọrọ onye ahụ n'ahụ, bido nyewe onye ahụ nsogbu."
Ihe ndị ọrịa akịrị abụghị
Dkta Ulasi kwuru na ọrịa akịrị abụghị nsi maọbụ agha ndị iro maọbụ abụmọnụ mmadụ na-abụ ibe ya maka imejọ ya.
Ọ rụtụrụ aka na e nwere "Ndị na-akpọ onwe ha ndị amụma, na ha bụ ụkọchụkwu karịrị akarị" ndị na-edufu ndị mmadụ rue oge ọrịa ha mebiri ọtụtụ ihe n'ahụ ha.
" Onye na-arị ọrịa akịrị ọ bụrụ naọ gaa ụlọgwụ n'oge, nwere olileanya iweta ngwọta.
"Onye nwe ọrịa, ya gaa ụlọọgwụ ma na-ekpekwa ekpere."
Ụdị ọrịa akịrị dị iche iche
E nwere ụdị ọrịa akịrị dị iche iche; ndị nwere ike ngwọta na ndị na-ata akị n'ahụ onye ọ na-arịa :
1. 'Acute kidney disease/injury'
"...Mgbe ihe mere akịrị n'ike, akịrị ahụ mebie maọbụ merụọ ahụ."
"E gbobido ya ma mee ihe e kwesịrị ime ,akịrị ga-adị mma."
Ima atụ: Ọrịa covid-19 nwere ike ibute 'acute kidney injury'.
2 'Chronic kidney disease'
Nke a bụ oge ọrịa akịrị taarala mmadụ nchara n'ahụ.
"Mgbe ụfọdụ onye na-arịa ọrịa akịrị anaghị ama na ọrịa dị ya n'ahụ."
"Ndị ụdị a na-arịakarị bụ ndị nwere ọrịa tara nchara dịka ọbara mgbalielu, ọrịa shuga, kansa na 'prostate'."
3 'Nephrotic syndrome'
Nke a bụ ọrịa akịrị na-eme ka protin karịa mamịrị onye ọ na-arịa.
Dkta Ulasi sị, "Nwatakiri nwe ụkwara, ọ nọkata ahụ ya azaba azaba."
O kwukwara na o nwere ike ime okenye.
Njirimara ọrịa akịrị
Ọrịa akịrị anaghị egosikarị onwe ya n'oge. njirimara ya na-eyikwa nke ọrịa ndị ọzọ.
Ihe were anya e ji mara ọrịa akịrị bụ ihu aka na ụkwụ ịza aza.
Mana e nwere njirimara ndị ọzọ gụnyere:
- Mammịrị ịcha nnukwu edo edo
- Ike ọgwụgwụ
- Ịnyụ oke mamịrị
- Ọbara dị na mamịrị maọbụ mamịrị gị ịdị oji
lhe ndị nwere ike ibute ọrịa akịrị
- Ịnụ ọgwụ Igbo
-Oke ịṅụ ọgwụ ahụ mgbu
-Aṅụghị mmiri ọfụma
- Ọrịa shuga
- Ọbara mgbalielu
- Ọrịa Bekee kpọrọ 'glomerulonephritis"
-Nje na-ebute ọrịa mamịrị dịka e-coli
Ụzọ ịgbalahụ ọrịa akịrị
- Onye ọbụla kwesịrị ịṅụ lita mmịrị abụọ kwa ụbọchị.
- Gbaara ịṅụ ọgwụ ahụmgbu maọbụ ịba aghara aghara ọsọ. Hụ dọkịta tụpụ ị ṅụọ ọgwụ ọbụla.
-Na-eme nnyocha ahụ oge ọbụla, e nyere ntuziaka ime ya.
-I nwe ọbaramgbalielu na-aṅụchịte ọgwụ dọkịta nyere gị anya.
-I nwe ọrịa shuga na-elekọta onwe dịka dọkịta si nye gị ntuziaka.
-Na-eri ezigbo nri na-edozi ahụ.
-Mmegharị ahụ
Ihe igbochi ọrịa akịrị ji ka ọgwụgwọ mma
Otu n'ihe igbochi ọrịa akịrị ji kaa mma karịa ọgwụgwọ ya bụ na ịgwọ ya abụghị ụtaba a chị n'aka agba egwu. Ya bụ ọrịa na-agba ego ọkụ.
Dkta Ulasi sị na naanị ime 'dialysis' otu ugboro na-eri puku naira iri atọ na ise (N35000), nke onye ahụ ya chọọ ya ga na-enwe ugboro atọ n'izu ụkọ.
E nwekwara ọgwụ ndị ọzọ onye ahụ ga na-aṅụ nke na-ada oke ọnụahịa.
N'aka nke ọzọ ịgbanwe akịrị nke a na-akpọ 'kidney transplant' na Bekee na-erikwa nde kwuru nde.
Onye e mere ya ga-ana agwụ ọgwụ ndụ ya niile iji hụ na ahụ ya ajụghị akịrị ọhụrụ e tinyere ya.