Ada Jesus death: Nwada a alaala mmụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ na-apụta ugbua bụ na Mercy Mmesoma Obi a ma dịka Ada Jesus anwụọla dịka ọ gbachara afọ 23.

Ada Jesus nwụrụ ụbọchị Wenezde n'ụlọọgwụ dị n'Abuja ebe e bugara ya maka ịgwọ ya ọrịa metụtara akịrị, abalị ole na ole o jiri mechaa ncheta ọmụmụ ya.

Otu onye ya na-ezinaụlọ ya dị na mma bụ Harrison Gwamishu gwara BBC Igbo n'ekwentị na akụkọ ahụ bụ eziokwu.

"Ọ nwụrụ n'ụtụtụ taa. Anyị na-agba mbọ etu anyị ga-esi ebuga ya n'ụlọ ozu."

N' ehihie Tuzde foro ụbọchị ọnwụ ya, BBC na di Ada Jesus bụ Kingsley Nnadi nwere mkparịtaụka ebe o kwupụtara ezi olile anya o nwere na Ada Jesus ga-agbake n'ọrịa.

Mana chi foro, fote ihe ọzọ.

Ihe nne Ada Jesus gwara Odumeje maka mgbaghara nwa ya nwaanyị

Nne Ada Jesus bụ ọkpaọchị ama ama agwaala Chukwuemeka Ohanaemere e ji Odumeje mara ka o weta akara ọba ego ya ka ọ kwụghachị ya ego otu nde o nyere nwa ya nwaanyị.

O kwuru na ihe kacha mkpa bụ mgbaghara ya bụ Odumeje gbaghara nwa ya nwaanyị na ọbụghị ego o nyere ya.

Ọ rịọrọ ndị niile nwa ya nwanyị kparịrị mgbaghara ma kele ndị niile gbatara Ada Jesus enyemaka ugbua ọ nọ n'akwa ọrịa.

O kwuru okwu niile a n'ihe nkiri na-efegharị n'intaneti ebe ya na onye amụma akpọrọ Kingsley ọkụ mmụọnsọ nọ na-akparịtaụka.

Ụnyahụ bụ April 17,2021 ka ihe nkiri ebe Odumeje nọ n'ụlọụka ya kwuo na ọ gbagharala Ada Jesus na-efegharị n'intaneti.

N'ihe nkiri ahụ , Odumeje nyekwara nna Ada Jesus naira otu nde naira.

Nne Ada Jesus kwukwara na ọ bụ eze obodo Odumeje rịọrọ ya ka ọ gbaghara Ada Jesus.

Rita Edochie, Odumeje, Ada Jesus: 'Chukwu abọrọla m ọbọ n'isi nwada a'

Onye na-eme ihe nkiri ama ama aha ya bụ Rita Edochie ekwuola na ọ gbagharala Ada Jesus bụ ọkpaọchị ama ama maka okwu ọjọọ o kwuru megide ya.

O kwuru si na obi dị ya ụtọ na ụwa amarala na Ada Jesus tụgidere ya asị.

O kwuru na ahụ na-arịa Ada Jesus gosiri na aka ya bụ Edochie dị ọcha.

N'okwu ya, "chineke abọrọla m ọbọ n'isi Ada Jesus. Ya gaa rịọ chineke mgbaghara nakwa ọgwụgwọ".

O kwuru na ọ gbagharala Ada maka ọtụtụ arịrịọ sị n'aka ndị nso nso ya si ebe niile ụwa sọtụrụ akpọ ya.

Ada Jesus Comedy,Chi Marine Temple,Odumeje,Rita Edochie: Ihe ikwesiri ịma maka okwu dapụtara etiti ha

Chi Marine Temple bụ onye dibia ekwuola na ọ gbagharala Mmesoma Mercy Obi, onye e ji Ada Jesus Comedy mara, maka mkparị ọ kparịrị ya.

Chi Marine Temple mere ihe onyonyo ebe o sekpuru ala na-arịọ Odumeje ka ọ gbaghara Ada Jesus dịka ya na onwe ya si mee.

O kwuru sị na ebe ọ nwereike ịgbagharanwu Ada Jesus n'agbanyeghi ụdịrị mkparị ọ kparịrị ya (nke ọ sị karịrị nke ọ kparịrị ndị ọzọ), na Odumeje bụ onye ụka kwesịrị imenwu ka o si mee.

Chi Marine mechara nye Ada Jesus ego iji tinye na nke o ji azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na Ada Jesus nọ n'ute ọrịa ugbua n'ihi mkparị ọ kparịrị ndị gụnyere Chi Marine Temple, Rita Edochie bụ ome ejije Nollywood nakwa Onye Amuma Chukwuemeka Ohanaemere e ji Odumeje mara.

Etu o si metụta Odumeje

Dịka nke a na-eme, ihe onyonyo malitere ifegharị ebe Edochie bụ ome ejije na Odumeje kwuru na ha agaghị agbaghara Ada Jesus maka ihe ndị o kwuru maka ha.

Odumeje bụ onye nna Ada Jesus kpọtara nwa ya ka ọ mara ma ọ ga-anata mgbaghara nakwa ọgwụgwọ n'aka ya, kwuru na o nweghi ike ịgbaghara ya n'ihi na ọ gbagharaburu ya na nke mbụ mana ọ gara n'ihu ka na-akpọ ya aha ọjọ, na-akatọ ya.

O kwuru na Ada Jesus mere ka ndị mmadụ na-akparị ya na Facebook, ma na-akpọ ya na ọ bụ onye amụma ụgha.

Ihe Rita Edochie kwuru

Edochie kwuru n'ihe onyonyo ahụ na Ada Jesus kparịrị ezinaụlọ ya, ma kwuo na ọ bụrụ na o nweela mgbe o kwuru na Odumeje na-akpọta ndị ọ na-eji eme ọrụ ebube ụgha, na aka ya agaghị eru ihe ọbụla ọ chọrọ n'ụwa.

N'otu aka ahụ, o kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị ihe o kwuru, na Ada Jesus agaghị esi n'ute ọrịa ya bilie.

Edochie kwuru na n'agbanyeghi ihe niile o meere Ada Jesus, na ọ gara n'ihu katọọ aha ya, na ọ bụ ya mere na ọ gaghị esi n'ute ọrịa ahụ bilie ruo mgbe o mere ihe ndị ọ sị ya mee.

Mana BBC Igbo kpọkuru Rita Edochie bụkwa ọnụ na-ekwuru Odumeje, mana ọ gwara anyị na ọ ga-aza anyị oku mgbe e mechara.