You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu kọwaa etu ị si gbalarị Egwu eke - Uwazuruike
N'ihe onyonyo na-efegharị na Facebook, onye ndu MASSOB bụ Ralph Uwazuruike kwuru ọtụtụ okwu banyere mpụtagharị Nnamdi Kanu.
Uwazuruike kwuru na ọ bụ ya bụ onye abụọ malitere ọgụ nnwereonwe Biafra ma a gụpụ Odumegwu Ojukwu.
O kwuru na ọ bụ ntọala anọ bụ nke ọ hapụrụ ka Nnamdi Kanu na IPOB ji achụso nnwereonwe Biafra.
Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ jụọ Nnamdi Kanu etu o si gbapụ n'ụlọ ya n'oge egwueke ahụ nke e gburu ọtụtụ mmadụ.
N'okwu ya "Kedụ etu Nnamdi Kanu siri gbapụ n'obodo Naịjirịa, kedụ ọdọụgbọelu, ọdọụgbọmmiri nakwa agbataobi o si gafee"
Uwazuruike kwuru na ajụjụ ndị a bụ ihe Nnamdi Kanu ji pụọ n'ala Naịjirịa gawa Izrel.
Kirie ihe Uwazuruike kwuru n'uju n'olu Bekee:
N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etu Nnamdi Kanu si hapụ ụlọ ya gbafuo n'oge ahụ.
O kwuru na ọ maghị etu Nnamdi si pụọ n'obodo Naịjirịa maka na ọ kọwabeghiri etu ahụ.
Ejiofor kwuru "Ihe dị mkpa bụ na Nnamdi Kanu dị ndụ ugbua, etu o si hapụ Naịjirịa pụọ, amaghị m"
Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ dịka Uwazuruike abụghị onye a na-asa okwu maka na onweghi aha.