You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu ka ọ bụ Peter Obi onye ka Ndigbo chọrọ ugbua?
Ọ bụ na Fraide nke ụbọchị 19 n'ọnwa Oktoba ka ihe onyonyo gosiri Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere na Jerusalem malitere ifegharị ebe niile.
Ụfọdụ mmadụ ekwetaghị na ọ bụ Nnamdi Kanu n'ezie mana ụfọdụ ndị nọ ya nso ndị gụnyere onye ọkwaiwu ya Ifeanyi Ejiofor na Paul Achalla kwuru na ọ bụ ya n'ezie.
A na-anụ kepukepu na Nnamdi Kanu ga-ekwu okwu na n'igwe Redio Biafra n'elekere isii nke abalị taa, bụ ebe ọ ga-akọwa ihe mere n'ụlọ ya n'oge ahụ ndị agha wakporo ya.
Kemgbe ahụ olu ndigbo kewara na soshal midia dịka ha na-ekwu na mpụta ya ga-ebute nsogbu na ntuliaka afọ 2019.
Ndị ọzọ jisike aṅụrị na mpụta ya ebe onye ọkwaiwu ya bụ Ejiofor na-ekwu na ndịagha Naịjirịa ga-azara ọnụ ha maka ntọọ atọrọ Kanu
Lee ihe ụmụ mmadụ na-ekwu na soshal midia.
David Onodu na-agwa ndị mmadụ ha gba mbọ gbado anya maka 2019.
Emeka Gift kwuru ka onye ọbụla na-aṅụ ọṅụ na Nnamdi alọtala.
Mazi Nwosu kwuru na onye ọbụla hụrụ Kanu dịka onye nzọpụta enweghi uche nke ya.
Henry Okafor na-ekwu ka Nnamdi Kanu n'onwe ya kwụnyere Peter Obi.
Jackson Ude kwụsiri ike na-ekwu na ọ bụ atụmatụ Buhari ịtọghapụ Nnamdi Kanu dịka ntụlịaka afọ 2019 na-abịa nso.
N'ime ihe a niile, anụbeghi olu Nnamdi Kanu ebe ndị nọ ya nso gwara BBC Igbo na Kanu bụ "oke mmanwụ a ga-akwado mpụta ya n'ọha".
Akụkọ ga-amasị gị: