You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu ga-emegwara ndị wakporo ezinaụlọ ya
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Nnamdi Kanu na-ekwu okwu n'elu igwe mgbasa ozi nke Radio Biafra.
BBC Igbo na-agbalị ịmata maọbụ Nnamdi Kanu n'onwe ya na-ekwu okwu mana onye ahụ kwuru na ọ ga-abọ ọbọ mwakpo emere n'ezinaụlọ ya n'afọ gara aga.
Ihe ndị ọzọ o kwuru na ya bụ ozi bụ na "ike agaghị agwụ anyị maọbụrụ na Naịjirịa enyeghị anyị referendum".
O kwuru na Chukwuokike Abịama gosiri ya mkpughe na Biafra ga-abịa na mmezu maọbụrụ na ndị mmadụ soro ụzọ bụ eziokwu.
Ihe ọzọ Kanu kwuru bụ na "onweghi mmadụ dị ndụ pụrụ igbu anyị (bụ ndị na-achọ Biafra).
N'ozi ahụ o bidoro ịsụ Bekee, tụgharịa ya n'Igbo ma laghachikwa na Bekee ka "ụwa nweike nụ olu ya".
Lee isiokwu ise Nnamdi Kanu kwuru n'ozi ya:
1. "Ihe mere eji mee 'Python Dance' bụ ka egbuo m".
2. "Ọ bụghị eziokwu na m gbajọrọ mkpebi ụlọikpe. Onye chọrọ ịgbajọ mkpebi ụlọikpe kwesiri ịma na ọ ga-etinye ya na nnukwu nsogbu. Ha mere m ka mgbapụ ọsọ n'ike".
3. Ikwu na Ipob bu otu oyiegwu bu ụgha. Ọ katọrọ ụlọikpe maka etu ha sị gba nkịtị ndịagha Naịjirịa nupu isi gbasara mkpebi ụlọikpe.
4. "A ga m anata n'ala Biafra. A bụghị m onye Naịjirịa, a jụrụ m ihe niile gbasara Naịjirịa n'afo 2015".
5. "Ndị otu IPOB nọ na mbaụwa niile agaghị ahapụ oku ha na-akpọ maka nkewapụta Biafra, ọ bụrụ na gọọmenti Naịjirịa chọọ ka anyị sonye n'ihe ọbụla a na-eme, ha nye anyị ohere "Referandum (mmwereonwe)".