Azọputala mmadụ itoolu, mmadụ atọ ka nọ n'ime ala n'ụlọ dara na Nnewi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ụlọelu ụlọatọ adaala n'Okpunu Otolo n'ime Nnewi, Anambara steeti.

Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ "TVC News" dere n'akara twitter ha ndị ụlọọrụ gbatagbata azọọla mmadụ ruru itoolu n'ime ebe a.

Ha kwukwara na ha ka na-agba mbọ ihu na azọpụtara ndị niile nọ n'ime ala ebe ụlọelu a dara.

Komishioner steeti ahụ bụ Garba Baba Umar gwara BBC Igbo na mmadụ atọ ka nọ n'ime ala ugbua.

N'ọnụ okwu ya: "Ụlọelu a dara n'ụzụ ụtụtụ taa bụ ụbọchị 18 n'ime ọnwa Oktoba oge mmadụ ruru 13 na-arụ ọrụ n'elu ya".

O kwukwara na ugbua ụlọọgwụ ahapụla mmadụ asaa n'ime mmadụ itoolu azọpụtara ugbua, mmadụ abụọ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ makana ha gbajiri ụkwụ.

O kwuru na ugbua anaghị enwe ike ikwu ma mmadụ atọ ahụ nọ n'ime ala ka dị ndụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị