Peter Obi: Ọ bụ eziokwu na Igbo enweghị otu obi?

Kemgbe Abubakar Atiku were Peter Obi dịka osote ya na ya ga-akwụ zọọ ọkwa onyeisiala na 2019,etu ndị gọvanọ Alaigbo jịrị sị na ha agaghị akwadọ ya n'ihiị na ha 'akpaghị ya akpa.

Nke a bulitere okwu n'etiti ndị mba ọzọ nke ha jị arụ ndị Igbo aka dịka agbụrụ n'enweghị otu obi.

Ọ bụghị naanị ha na-eche otu a, ndị ntorobịa Igbo ụfọdụ na-ekwukwa na nsogbu Igbo bụ Igbo, na Ndịgbo enweghị otu obi, kama ha bụ nshịkọ na-anọchị ibe ya ebe ọ galighi.

Okwu ha abụghị okwu ọnụ efu n'ihi ọgbakọ ndị ndu PDP ọwuwa Anyanwụ na-eme n'isi Peter Obi abụghị nke mbụ Igbo na-akponye aja na garị ibe ha.

Ọtụtụ mgbe, oke rutere Ndigbo na-agbalahụ ha dịka onye ọbụla n'ime ha na-achọ ọdịmma onwe ya, hapụ nke agbụrụ ya.

Lee ọtụtụ mgbe Igbo wụrụ onwe ha n'ala n'anya agbụrụ ndị ọzọ n'ihi enweghiotu obi na nkwekọrịta:

1.Alex Ekwueme na Jim Nwobodo

Ụmụ Naijirịa anaghị echefu akụkọ etu Jim Nwobodo jiri kerie vootu gaara enye Alex Ekwueme larala mụọ ohere imeri na ntuliaka imeụlọ pati PDP mere na Jos n'afọ 1999 maka ọkwa onyeisiala.

2. Ịzọ ọkwa onyeisi Sineti n'oge Ọchịchị Obasanjo

Ọ bụ okwu metụtara adịghị n'otu nakwa ịchọ nke bụ nke onye mere na Ndigbo nyere ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa onyeisi ise naanị afọ asatọ Olusegun Obasanjo chịrị dịka onyeisiala Naịjirịa.

Ọchịchị onyeisi Sineti sị n'aka Evans Enwere(1999) fere n'aka Chuba Okadigbo(1999-2000).

O sikwara n'aka Okadigbo banye n'aka Anyim Pius Anyim(2000-2003).

O sikwa n'aka Anyim banye n'aka Adolphuis Wabara (2003-2005) ma bie n'aka Ken Nnamani( 2005-2007.)

Agbanyeghị na ebubo nrụrụaka na ọchịchị aka ike so na nkata gbudoro ha, mana o doro ewu na ọkụkọ anya na ndị Igbo nọ na Sineti oge ahụ so gwuo olulu loro nwanne ha.

3. Uwazuruike/Nnamdi Kanu

Ọ bụghị naanị na ndọrọndọ ọchịchị ka Ndigbo na-egosi adịghị n'otu.

Agbanyeghị na mkpu mnwereonwe Biafra bụ okwu na-eti ka ebilimmiri n'Igbo dum, adịghị n'otu emeela ka ọtụtụ otu kewapụta sị na ha na-agba mbọ ịlụrụ Ndigbo ọgụ mnwereonwe.

Kemgbe MASSOB nke Ralph Uwazuruike bidoro malitere, Nnamdi Kanu kewara bido nke ya bụ IPOB.

Ndị ọzọ gụnyere Biafra Nations Youth League (BNYL), Biafra Independence Movement (BIM) nke Uwazuruike siri na Massob pụọ ga-mepee, Zionist Movement nke Ben Onwuka dgz.

A nyụkọghị mamịrị ọnụ mere na onye na-egwu n'elu, ibe ya a na-ekwu n'ala.

Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru maka adịghinotu Ndịgbo

Ihe ndị ma nke a na-akọ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na ihe kachasị mee Ndigbo asụọ ala ma akọghị ji dịka Elliot Ugochukwu siri kọwara BBC Igbo bụ na ọtụtụ ndị ndu Igbo na-achụ maka onwe ha na ezinaụlọ ha hapụ ọdịmma Igbo niile.

Ugochukwu gara n'ihu kwuo na"Ndị ndu Igbo bụ ndị ndu enweghị ndị na-eso ha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: