You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Orji Uzor Kalu: Onweghi ihe dịka mmachi njem
Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia Steeti ekwuola na onweghi okwu banyere akụkọ na-ekwu na aha ya so na ndị a machiri ime njem na mba ofesi.
N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, O kwuru na onweghi ihe nke ahụ pụtara na ọ gaghị aza ajụjụ banyere ya.
Kalu Kwuru na okwu a abụghị ihe a na-etinye ọnụ na onweghi ihe dị etu ahụ.
Cheta na akụkọ kwuru na onyeisiala Buhari nyere iwu ka a machie ọtụtụ ndị site n'ime njem a ga mba ofesi bụ nke PDP, Afenifere na ndị ọzọ katọrọla.
Mana onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onweghi aha ndị amachiri ime njem ha wepụtara na ọ bụ nke ha ritere n'aka ọchịchị gara aga.
Gịnị bụ Ikike iwuOnyeisiala:
Onye ọkaiwu bụ Godwin Uwazuruike kọwaara BBC Igbo ihe bụ ikike iwu onyeisiala akpọrọ 'Executive Order' na bekee.
O kwuru na iwu a na-enye onyeisiala ikike ịmachi njem onye ọbụla ha na-enyocha mere ihe ọjọọ ka ọ ghara ịgba ọsọ.
O kwuru na iwu esighi n'aka ndị ọkaiwu ma ọ bụ ndị ụlọomeiwu nke Naịjirịa pụta na onyeisiala enweghi ikike inye ụdị iwu dị etu a.
Uwazuruike kwuru na ọ bụ naanị ndị ụlọomeiwu nwere ikike ime iwu, ebe ndị ọkaiwu na-achabi iwu mana onyeisiala enweghi ụdị ikike ahụ.
O kwuru na mkpebi bụ imegide ikike ndị ụlọomeiwu na ndị ọkaiwu na ọ bụghi ihe ziri ezi dịka ọkaikpe nyere ha ikike ji dọọ ha aka na ntị.