You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Orji Kalu amaala afọ n'ala n'ikwụsị nyocha ya.
Onye ọkaikpe Muhammed Idris nọ n'ụlọikpe dị n'Ikoyi, Legọs kagbuo mgbesa aka chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu maka ịkwụsi ndị EFCC inyocha ya.
Nyocha a ndị EFCC na-eme Kalu bụ maka ebubo aghụghọ ego dị ijeri naịra atọ na ọma.
Dịka ọ dị ugbua, Orji Uzor Kalu so n'otu n'ime ndị isi ọchịchị pati APC bụ ndị na-achị Naịjirịa ugbua.
Kalu na onye bụbu kọmishịọna ya na-ahụ maka ego bụ Jones Udeogu nakwa ụlọọrụ Slok bụ ndị ụlọọrụ EFCC na-enyocha.
Cheta n'ọnwa Mee afọ 2018, onye ụkaikpe na-anọchi anya Kalu bụ Awa Kalu degara ụlọikpe akwụkwọ ka akachapụ ebubo eboro ya.
Nke ụlọikpe zara taa, ma kwuo ka Orji Uzor Kalu gaa n'ihu zara ọnụ ya n'aka ndị EFCC.