You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe akwụsịla ịṅụ iyi ọrụ Ekenze dịka osote gọvanọ n'Imo steeti
Ụlọikpe nọ n'isi obodo Imo steeti bụ Owere akwụsịla idu iyi ọrụ e kwesiri idu Calistus Ekenze dịka osote gọvanọ steeti ahụ.
Ekenze kwesiri ịnọchị Eze Madumere bụ onye akụkọ pụtara ụnyaahụ na a chuturu ya n'ọkwa ahụ ebe ọ bịaghị zara ọnụ ya maka akwụkwọ a gbara ya.
Ikpe ụlọikpe ahụ bịara taa dịka a chọrọ ibodo idu Ekenze iyi ọrụ ahụ.
Ọkaikpe steeti ahụ bụ Miletus Nlemadimgwara ndị gbakọrọ maka mmemme idu iyi ọrụ ahụ maka ya bụ ikpe nke mere e jiri kwụsị ya bụ mmemme.
Cheta na nchutu e mere Eze Madumere mejọrọ iwu ụlọikpe nyere n'ụtụtụ ụnyaahụ ịkwụsị usoro nchutu ya.
Ọkaikpe Ben Iheka nyere iwu ka a kwụsị usoro niile e ji maka nchutu Madumere rue mgbe a ga-eme mkpesa maka ikpe ahụ ma kpezie ya.
Mana ndị ụlọomeiwu steeti ahụ gara n'ihu chutuo ya ụnyaa.
Madumere kwuru na ya ga-aga ụlọikpe maka nchụda ya.
BBC Igbo gbara mbọ inweta ụlọomeiwu Imo ka a mara ihe ga-emezi mana onweghi ony zara oku.