You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe idemmiri na-eme n'ala Igbo ugbua
Udu mmiri abịala ọzọ, ihe a ebutela nnukwu idemmiri na ọtụtụ ebe di icheiche mana akụkọ ugbua gosiri na ọtụtụ ebe n'ala Igbo emeghị njikere nke ọma maka udu mmiri a.
Cheta n'ime izuụka gara aga ndị ụlọọrụ National Emergency Management Agency' (NEMA) na Bekee kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo ndị dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa.
Mana ka o si-aga ugbua, ide mmiri na-asizi ndị mmadụ 'kwapu-kwapụ' n'ọtụtụ ebe n'ala Igbo.
N'ime akụkọ a, anyị ga-egosi foto di icheiche gosi ebe ide mmiri mebiri ọtụtụ okporo ụzọ n'ala Igbo.
Owere
Stephen Mbonu zitere anyi foto nke a gosi ide mmiri na-eru n'okporo ụzọ MCC Road, Urata n'ime Owerre n'Imo steeti mana ọ kọwara na mmiri a na-agbada agbada na ngwụcha ole na ole.
Foto ndị a, nwanyị aha ya bụ DebbyEloo Ifejiofor Ezeamama setera bụ nke kachasị njọ.
Okporo ụzọ a, dị na mgbemena n'Awada, Onitisha n'ime Anambra steeti.
Okporo ụzọ a kewara maka mmiri ji ụbọchị ole na ole zoo.
NIMET ka na-adọ aka na ntị na oke mmiri a ezochabeghị.
Ọtụtụ mmadụ akwapugo n'ebe ide mmiri mebiri ụzọ.
Nke a bụ ozi Pharez Okpere dere gosi ebe ide mmiri mebiri ụzọ na Benin n'ime Edo steeti.
Otu nwoke aha ya bụ Nnamdi Ojiego kowara BBC na Ide mmiri emebiela okporo ụzọ Ọlụ-Ideatọ-Ụga kamgba afọ iri na ise garaaga.
O kwukwara na obodo dịka Obioha na Umuchima bụ ebe ọ kachasị dị njo na mpaghara ebe a.
N'ọnụ okwu ya: "Ọ bu gọọmenti ka ikpe mara na nsogbu a. N'obodo dịka Akowa na Umuchima, ọ bụ gọọmenti kwariri ụzọ a iji rụọ ya, mana ruo ugbua, onweghị ọrụ ọbụla metutara okpọrọuzo ndị a"
Akụkọ ga-amasị gị