You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
NLC agwala ndị Naịjirịa anabatakwala iwu ụtụisi gbagọrọ agbagọ
Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akpọkuola ndị Naịjirịa ka ha ghara ịnabata iwu ụtụisi gbagọrọ agbagọ.
NLC rụtụrụ aka na mkpa ọ dị gọọmenti ịgụnye onye niile n'ihe ha na-eme, ma hụkwa na ọ ga-adabara onye niile.
Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero kpọrọ oku a n'ozi Ekeresimesi o zigaara ụmụafọ Naịjirịa n'ụbọchị Wenezde 24 Disemba, 2025.
Ajaero kwuru na mgbagọ nakwa ebubo ịkụ akụrụakụ sochiri iwu ụtụisi ọhụrụ Naịjirịa na-agba ụkwụ megide ntụkwasịobi ọhanaeze.
End of Etu ụtụisi Naịjirịa si wee gbanwee
"Na njikọaka n'oge a nakwa n'ọdịnihu, anyị kwesịrị ịgba isi akwara ka e mee ihe kwesịrị ekwesị gbasara iwu ụtụisi, bụ ebe ndị bara ọgaranya ga-akwụ oke ruuru ha," ka Ajaero kwuru.
"Iwu ụtụisi ọbụla jupụtara na mgbagọ na akụrụakụ bụ nke a na-agaghị anabata, ma bụrụkwa nke onye niile kwesịrị ịgbaara ọsọ kpam kpam."
Ọ kpọrọ oku ka e jiri ụtụisi mepụta ihe dị mma, ma kwuo na ụmụafọ Naịjirịa niile kwesịrị inwe ohere nlekọta ahụike, agụmaakwụkwọ na ezi nchekwa, dịka a ga-erubeisi nye ikike na ụgwọọrụ nke ndị ọrụ obodo.
Ajaero gwara ndị Naịjirịa ka ha gaa n'ihu dịrị n'otu dịka ha na-akpọ oku maka ezi ọchịchị ga-adabara onye niile.
O kweghachiri nkwa na ya dị njikere ịkpọkọta ndị ọrụ ka ha gbaa ụkwụ megide atụmatụ ndị ga-eme ka ajọ ọnọdụ akụnaụba kawanye njọ na Naịjirịa.
Iwu ụtụisi: Ndị Ọkaiwu enyela Onyeisiala na ndị Ụlọomeiwu Naịjirịa akwụkwọ ikpe
Otu ndị Ọkaiwu akpụpụla Onyeisiala Bola Tinubu na ndị omeiwu Naịjirịa n'ụlọikpe maka iwu ụtụisi ọhụrụ.
Ndị otu a kpọrọ onwe ha Lawyers for Civil Liberty (LACIVLER Development Foundation) mere ka a mata nke a n'otu akwụkwọ ha ziteere BBC News Igbo n'ụbọchị Tuzde 23 Disemba, 2025.
LACIVLER Development Foundation kwuru na ha kpụpụrụ Onyeisiala na ndị omeiwu Naịjirịa n'ụlọikpe maka ebubo ikwu otu ihe, ma gaa n'azụ tinyekwo ihe ọzọ gbasara iwu ụtụisi ọhụrụ.
Ha kwuru na ha akpọtụrụla otu dị iche iche na mbaụwa ka ha were anya ha hụ ka ikpe ahụ ga-esi gaa, iji hụ na e nwere nkwụwaakaọtọ.
Otu ndị ahụ gụnyere; International Bar Association, Amnesty International, Transparency International, Open Society Justice Initiative no n'Amerịka, International Commission of Jurists dị na Geneva, Tax Justice Network dị na United Kingdom, Human Rights Watch nke mba Amerịka na Centre for Law and Democracy dị na Kanada.
Ebumnobi ndị otu Lawyers for Civil Liberty bụ iji mee ka mbaụwa hụ ihe ha kọwara dịka "mmetọ ọchịchị onye kwuo uche ya", nakwa iji hụ na e ji ikike mbaụwa dozie ya karịa ịgbachi nkịtị ka ihe mebie.
Kedụ ka okwu izubata ihe n'ime iwu ụtụisi si bido?
Ọ bụ n'ụbọchị Juun 26 ka Onyeisiala Tinubu binyere aka n'iwu ụtụisi ọhụrụ maka ụmụafọ Naịjirịa.
Ka ụbọchị ole na ole gara, otu onye omeiwu nnọchiteanya bụ Abdulsamad Dasuki pụtara gosi mmetụta gbasara ihe ọ kọwara dịka ndịiche dị n'iwu ụtụisi nke ụlọomeiwu Naịjirịa nabatara na nke gọọmenti chịkọtara ma wepụtara ọhanaeze.
Dasuki kwuru na emetọrọ ikike ya dịka onye omeiwu n’ihi na ihe dị n’ime iwu ụtụisi nke gọọmenti chịkọtara egosipụtaghị ihe ndị omeiwu rụrịtara ụka ma nabata n’ime ụlọomeiwu.
Mana obi ọchịchị Naịjirịa agọọla na o nwere ụdị ihe a mere. N'agbanyeghị nke a, ndị otu Lawyers for Civil Liberty na-ebo ebubo na o nwere ihe ụfọdụ gọọmenti zubatara na mpaghara dị iche iche n'iwu ụtụisi ọhụrụ.
O nwere iwu kwadoro izubanye ihe n'iwu ụtụisi?
Dịka LACIVLER Development Foundation siri kwuo;
1. Iwu nwere ndịiche na nke ụlọomeiwu nabatara na nke e wepụtaara ọhanaeze agaghị abụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka inye ndị dara iwu ụtụisi ntaramahụhụ.
2. Onyeisiala, ụlọọrụ, otu maọbụ ngalaba gọọmenti ọbụla agaghị etinye iwu e zunyere ihe n'ime ya n'ọrụ.
3. Iwu a sị ụlọomeiwu nabatara bụ nke a na-agaghị etinye n'ọrụ ma ọ bụrụ na nke e gosiri ọhanaeze dị iche na nke ụlọọmeiwu rụrịtara ụka ma nabata.
4. Ọ bụ ọrụ ụlọomeiwu ịhụ na iwu nke ha nyere Onyeisiala ka o binye aka na nke ha nabatara bụ otu, ma ọ bụghị ya iwu ahụ agaghị enwe isi.
5. A gaghị atụ anya na ụmụ mmadụ ndị ruru ogogo ịkwụ ụtụisi ga-erubeisi maọbụ kwụọ ụtụisi ha dabere n'iwu a na-enyo enyo.