Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ekweremadụ sị na ya ahusiele anya n'ọchịchị a

Ekweremadu sị na ya ahusiela anya na gọọmenti a

Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekeremadu agụpụtala ugboro ole na ole a nwalere ịchụpụ ya n'ọkwa.

Ekweremadụ kwuputara nke a mgbe Achịbishọp ụka Anglịkan n'Enugwu bụ Emmanuel Chukwuma gara iti ya aka n'obi maka ọnwụnwa niile ọ na-agabiga.

Buhari chọrọ itunye Ịmam zọrọ ndị otu Kraisti narị atọ na Platu steeti ugo

Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọla oku ka akpọtara ya Abdulahi Abubakar bụ maka nturuugo ala Naịjirịa.

Abubakar bụ Ịmam ahụ zọpụtara ọtụ ndị otu kraistị narị atọ mgbe ndị Fulani na-achi ehi na-egbu mmadụ na Barkin Ladi, Platue steeti Ịmam zọrọ ndị otu Kraisti narị atọ na Platu steeti na ọgbaghatara mere nso nso.

EFCC na-ebo Ortom ebubo nrụrụaka

Ụnụ ahụla e, Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC ebola Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue steeti ebubo imefu ego ruru ijeri iri abụọ na abụọ.

Ha na-ebokwa mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ ebubo nde kwuru nde asị na ha mefuru.

Nọt Korịa ebidola ọzọ?

Akụkọ na-akọ na ọ dịkwa ka mba Nọt Koria ka na-aga n'ihu ịrụpụta ogbunigwe nuklịa

agbanyeghị aka niile Amerika dọrọ ha na nti.

Onye ọrụ mba US akpọghị aha ya gwara Washington Post na mgbama 'Satelite' mba US nyopuru nke a.

N'egwuruegwu,Onoriode Ehwarieme sị naọgụ na-agụ ya

Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a

Lee ihe nkiri anyị