You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
PDP: Anyị họrọ Peter Obi maka ị kwado NotTooYoungToRun
"N'ime mmadụ niile ndị a họpụtara, Peter Obi kachasị tozu ọkwa ahụ" bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere otu PDP Diran Odeyemi gwara BBC n'ekwentị.
O kwukwara na ọ bụghị maka ebe Peter Obi si bụ mpaghara ọwụwa anyanwụ ka Atiku na ndị otu PDP ndị ọzọ jiri họpụta ya.
Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na Atiku mere ọfụma ị họpụta Peter Obi n'ihi na ọ bụ nwoke aka ya kwụ ọtọ na-eme ihe o kwuru
Ebe a na-anụ na Peter Obi na onwe ya emepela akara Twitter nke ya taa mana amabeghị ma ọ bụ nke ezigbo ya.
Akụkọ n'ụbọchị Fraide na Atiku Abubakar ahọpụtala onye bụbụ gọvanọ Anambra state bụ Peter Obi dịka onye ga-abụ osote ya.
Otu onye na-achọghị ka mara aha ya gwara BBC Igbo na Atiku na Peter Obi mere nzukọ ụnyaahụ.
Cheta na otebeghị aka ndị mmadụ bidoro jụwa ma Atiku a ga-ahọrọ Ngozi Okonjo-Iweala, Peter Obi, Ike Ekweremmadu na Soludo dika osote na ntụliaka 2019.
Atiku meriri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka imeụlọ PDP mere na mbido October.
Kamgbe ahụ ndị mmadụ na-elo onye ga-abụ osote ya.
Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:
@adeyanjudedeji kwuru na nke a gosiri idi n'otu. O jikwa ohere a kele ụmụ Igbo maka atụmaatụ a.
@TWEETORACLE kwuru na ihe mere Atiku ji họrọ Peter Obi bụ makana ha abụọ ghọtara ihe gbasara idozi akụ na ụba obodo.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: