Iniobong Umoren case: A maala Uduak Akpan ikpe ọnwụ ịkwụ ya ụdọ maka ogbugbu nwada a.

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ọkaikpe Bassey Nkanang nke ụloikpe ukwu dị n'Akwa Ibom Steeti amaala Uduak Akpanm ikpe ọnwụ ịkwụ ya ụdọ maka ogbugbu Iniobong Umoren.

Cheta na Umoren bụ nwata nwaanyị gụchara mahadum na-achọ ọrụ were danya n'aka Uduak Akpan bụ onye gburu ya.

Ọkaikpe hiwere mpịachi ikpe a dịka ndị gbara akaebe dechara akwụkwọ akaebe ha.

Uduak Frank Akpan atụgharịala gọọ na o gbughị Iniobong Umoren

Uduak Frank Akpan a na-ekpe ikpe maka ọnwụ Iniobong Umoren atụgharịala kwuo na o gbughi nwaada ahụ.

Akpan bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo gọọmentị Akwa Ibom boro ya na ọ raala, dịnaa ya n'ike ma gbuo Inobong ebe ọ na-achọ ọrụ.

Mgbe mbụ akpụpụrụ ya ụlọikpe n'ọnwa Julai, o kwetara na ọ bụ ya gburu ya ma kọwaa etu o si mee ya.

Ugbua ọ pụtakwara n'ụlọikpe n'ihu ọkaikpe ọhụrụ bụ Bassey Nkanag ka ọ tụgharịrị okwu ya.

Ọkaikpe ahụ bụgharịrị ikpe ahụ rue ụbọchị 15 ọnwa Nọvemba ma kwee nkwa na ọ ga-ekpe ikpe ahụ ngwa ngwa ma nye mkpebi tupu a gbaa Easter afọ 2022.

Iniobong Umoren: Ọ bụghị eziokwu na Uduak Akpan kwụrụ ụdọ - Ndị Uweojii

Ndị uweojii Akwa-Ibom steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na nwa amadị a na-enyo maka ọnwụ Iniobong Umoren bụ Uduak Akpan akwụọla ụdọ.

Iniobong Umoren bụ nwata nwaanyị e dilara n'ike, gbuo ma lie n'Akwa-Ibom dịka ọ gara ịza oku ajụjụọnụ maka ọrụ n'Akwa Ibom izu ole na ole gara aga.

Komishona ndị uweojii na steeti ahụ bụ Andrew Amiengheme onye gbara ama dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ banyere ebe okwu kwụ na nnyocha ọnwụ Umoren n' ụbọchị Fraide na "Ọ bụghị eziokwu na Uduak kwụrụ ụdọ".

"Ọ bụghị eziokwu na Uduak gburu onwe ya n'ebe a. Ọ bụ ihe mwute na soshal midia na-enyere ndị uweojii na ndị mmadụ aka bụzị ihe e ji agbasa akụkọ ụgha."

O kwuru na ọ bụ asịrị ahụ mere ka ha kpụpụtara Uduak ka ọha hụ na ọ ka dị ndụ.

O kwukwara na nnyocha e mere ozu Umoren gosiri na "O doro anya na enwere apa gosiri n'ebe afọ ya nakwa ụkwụ ya."

N'okwu ebubo na e nwere ili juru n'ebe ahụ e liri Umoren, Amiengheme kwuru na "O nweghị ili ọbụla, ọ bụ ebo ji ebe e wepụrụ ji bụ ihe dị ebe ahụ."

N'otu aka ahụ, Akpan gwara ndị ntaakụkọ na Umoren bịara amaka ajụjụ ọnụ maka ọrụ n'ezie.

"A jụrụ m ya ma o nwere ike ịrụ ọrụ odeakwụkwọ n'ugbo ebe a na-edobe ọgwụ ike, ya ekwe."

"Mgbe ọ bịara m gwa ya na o nweghị ugbo ọbụla, na ọ bụ njakịrị. M were gwazie ya ka amụ na ya mee kọọ O kwere were sị m na ọbụ ma e ji m okpu nna bụ enye."

"Oge m wepụrụ okpunnabụenyi, iwe gbara ya o were igwe 'stablizer' kụọ m n'isi, taa ya n'aka ikpe."

"Mgbe m na-agba ọbara, iji zọọ onwe m mwere stabilizer ahụ kụọ ya, ọ daa gbawa ọbara, mechazịa nwụọ."

Akpan kwuru na akpụkpọ ụkwụ ndị na-efe ala nna ya a hụru n'ụlọ ha bụ nke nne ya.

Nkwụpụta ndị a na-abịa dịka ezinaụlọ Ini umoren mere akwamozu ya taa bụ Fraide , abalị iri na anọ nke ọnwa Mee,2021 na Nung Ita Ikot Obio Enin Atai dị n'steeti ahụ.

Ịzụ akwa na anyamiri zoro ka mmiri dịka igwe mmadụ juru n'ezi nna ya dịka ha bịara ịkwanyere ya Ugwu Ikpeazụ.

N'ozi ya n'akwamaozu ahụ, aka na-achị Akwa-Ibom bụ Emmanuel Idom kwụrụ ya ga-eme ihe niile ịhụ na ezinaụlọ Umoren nwetara ikpenkwụmọtọ.

O kwuru na ihe mere na ya ekwubeghị okwu maka ihe mere bụ iji nye ohere ka ndị uweojii rụọ ọrụ ha.

Uduak Frank vs Iniobong Umoren: Etu nwada a si nwụ mgbe ọ gara ịchọta ọrụ bekee

Ndị uweojii nọ n'Akwa Ibom steeti anwụchiela Uduak Frank dị afọ iri abụọ a na-eche na ọ wakporo ma gbuo Iniobong Umoren, lie ya n'obere ili.

Ọnụ na-elwuru ndị uweojii na Akwa Ibom steeti bụ Odiko MacDon depụtara n'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ na ọ bụ ngalaba Anti-Kidnapping Squad ndị uweojii nụchịrị ya ka ha si chọpụta

Ọ kọwara etu nwada a si nwụ n'aka onye gwara ya, ya bịa ka o nye ọrụ n'Akwa Ibom.

O depụtakwara na nwa amadi ahụ ga-agwa onyeisioche okpuruọchịchị ya maka mpụ o mere tupu ọ gbara gawa Calabar mana o nweghị onye kpọgara n'ụlọọrụ ndị uweojii.

O kwuru na ha mecha ya nyocha , ha ga-akpụkpụ ya ụlọikpe.

Onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia gosikwara Odiko MacDon ebe ọ na-ekwu na ha egwuputela ozu Iniobong n'ili ahụ ma bụga ya ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ 'University of Uyo Teaching Hospital UUTH."

O kwukwara na ga-ebuga ozu Iniobong n'ebe a ga-eme ya nyocha maka ihe ngosi n'ụlọikpe.

Ihe ọyị Umoren depụtara maka ọnwụ ya

Ọyị ya ji akara @UmohUduak nọrọ na twitter ma tie mkpụ maka ọfufu Umoren gwara BBC maka ọnwụ ya.

"E gbuola ezigbo ọyị m ma lie ya, o kwuru n'etiti mkpụ na akwa dara uda."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Akwa Ibom steeti bụ Odiko MacDon gwara BBC na ha na-akwado ịchịkọta nyocha ha nke ga-eme ka ha wepụta nchọpụta nso nso a.

N'elekere asatọ nke ụtụtụ Sọnde taa bụ ụbọchị May 2,2021, Umoh Uduak kwupute maka ọnwụ Umoren na twitter.

Ndị uweojii kwuru n'ụbọchị May 1, 2021 na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-eche na aka ha dị n'ofufu Umoren.

Kedụ ebe mmiri si ba n'opi ụgbọgịrị?

N'ụbọchị Eprelu 29,2021 ka @ @UmohUduak ji akara #HinyNumoren iji kwupute na ọyị ya nwaanyị nọ na nsogbu ka agbatara ya ọsọ enyemaka.

Uduak ji 'Happiness Activist ' nọrọ na Twitter kwuru na ọyị ya nwaanyị gwara ya nọ ọ na-aga ịza oku ajụjụ ọnụ ọrụ n'Airport road n'Aprelu 29 mana ọ bataghị kamgbe ahụ.

O kwuru na ebe a na-eme ya bụ ajụjụ ọnụ ọrụ ahụ ọyị ya chọtaratere ezigbo aka n'ebe o bi.

O kwuru na ọyị ya nwaanyị zitere ya onu ya n'ozi etinyere n'ekwenti mana mgbe ọ kpọghachiri ya, mkpụ ya ka ọ nụrụ.

@HinyHumoren kpọrọ onwe ya Iron_Lady na Twitter nakwa onye na-ere ahịa ude ndọzi ahụ nakwa hụrụ ndị mmadụ n'anya.

O depụtekwara n'akara twitter ya na ọ na-achọ ọrụ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na twitter