Say no to rape: Ihe nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike

Akụkọ mwakpọ ụmụnwaanyị bụ ihe na-akpọtu ebe nile ugbua.

Na nsonso, ndị amabeghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo otu nwata akwụkwọ mahadum 'University of Benin' bụ Uwaila Uwavera n'ụlọụka ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ n'abalị.

Ka a na-ekwu nke ahụ, a wakporo nwagbọghọ ọzọ a kpọrọ Barakat Bello n'Ibadan dị n'Oyo steeti.

Nsogbu ụfọdụ buteremgbalite eelu mpụ iwakpo ụmụnwaanyị bụ aghọtaghị iwu.

Gịnị bụ mwakpo?

Dịka iwu Naijiria Naijiria (Section 282,Cap 89 Penal code) nke gọọmenti etiti si kwuo "A na-asị na nwoke mere mwakpo ma ọ bụụ na ya na nwaanyị maọbụ nwa nwaanyị nwere mmekọrịta n'ọnọdụ ndị a; a- A manyere amanye b- O kwetaghị; c- O kwetetara mana i yiri ya egwu ọnwụ maọbụ mmerụ ahụ. d-O kwetara,mana nwoke ahụ abụghị di ya mana o kwetara chee maọbụ di ya e-O kwetara maọbụ na o kwetaghị mana ọ dị afọ iri na anọ maọbụ pekarịa maọbụ uche ya ezughị ezu

Ihe nwaanyị akwasoro iko n'ike ga-eme

Ọtụtụ mgbe a na-akwaso ọtụtụ ụmụnwaanyị iko n'ike mana ha anaghị enweta ikpe ziri ezi maka nke a.

Ụfọdụ n'ime ha amaghị usoro ha ga-eji gbasoo ya maka i nweta ikpe ziri ezi, ebe ụfọdụ na-eme ihere ikwupụta na a kwasoro ha iko n'ike.

Onye ọkaiwu na-ahụ maka mgbochi mwakpọ bụ Dorothy Chukwumezie Oleka na ọnụ na-ekwkuru ndị uweojii na Anambara steeti bụ Haruna Mohammed nyere ntuziaka ụzọ ndị a ga-eji nweta ikpe ziri ezi n'ụlọikpe.

1. Ihe mbụ nwaanyị akwasoro iko n'ike ga-eme bụ ị gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii ngwa ngwa awakpochara ya.

Mohammed kwuru sị, " Ngwangwa mwakpo mere, wegara ndị uweojii mkpesa, ha ga-akpọ onye ahụ gaa ụlọọgwụ iji nata akwụkwọ nchọpụta ihe ha chọpụtara bụ ihe a ga-eji mee ihe akaebe n'ụlọikpe."O kwurukwara ka a ghara ịkpala akwa "onye a wakporo yi maọbụ ebe ihe ahụ mere ganye na ndị uweojii emecha nchọpụta ha."

" Ime otu a ga-emetụta ihe akaebe ma nye onye mere ihe ahụ ohere ị nla n'efu."

2. Na nwaanyị a agaghị asapụ ahụ ya maọbụ uwe o yi mgbe awakporo ya tupu ọ gawa ime mgbesa ahụ.

Nke a bụ ka ọ gbara ihichapụ ihe akaebe a ga-eji nyocha ma maa onye wakporo ya ikpe.

3. Ndị uweojii ga-akpọ ya gaa n'ụlọọgwụ ebe onye dọkịta ga-enyocha ya ahụ ma were ihe akaebe ndị ahụ.

4. Nwaanyị ahụ ga-akọwara ndị uweojii onye wakporo ya iji nyere ha aka nwụchie ya ma malite ikpe ya ikpe.

5. Ọ bụrụ na a kpọpụ ya n'ụlọikpe, nwaanyị ahụ ga na-abịa n'ụlọikpe dịka onye ịgbaama megide nwoke wakporo ya.

Ihe mere nwaanyị anaghị ekwupụta ma awakpo ya n'ike

Dorothy Oleka kwuru na ihe mere ọtụtụ ụmụnwaanyị ji ghara ikwu maka ịkwa iko n'ike megide gụnyere;

  • Iwu kwuru na ị ga-eweta rịrị ihe akaebe tupu a maa nwoke ahụ ikpe.
  • Etu ndị mmadụ nakwa ndị agbataobi si akwa nwaanyị a wakporo n'ike emu na-ebute ya ihere .

N'iji kwụsị nke a, Oleka sị na ezinaụlọ nke nwaanyị ahụ kwesiri ịdọnyere ya ukwu n'oge ndị a niile iji mee ka obi sie ya ike.

O kwuru na ọ ga-adịkwa mma ka ha kpọpụ ya na gburugburu ebe ihe ahụ mere nwa oge.

Oleka gara n'ihu kwuo na nwaanyị ahụ nwereike inweta ikpe ziri ezi mgbe o kpebiri ime mkpesa n'aka ndị uweojii na mpụ enweghi oge ọ gaghị abụsị mpụ.

O kwuru na ọ ga-enye nsogbu ma ọ bụrụ na ihe akaebe adịghị kama na ọ ga-eme ka ndị mmadụ gbadoo anya n'ebe nwoke dị etu ahụ nọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: