You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Busola Dakolo: "Etinyeghi m aka n'akwụkwọ isepu aka n'ikpe mụ na Fatoyinbo"
Busola Dakolo gwara BBC na o tinyeghi aka n'akwụkwọ ọbụla a sị na ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo nke Coza gbara maka ikpe ịwakpo ya n'ike.
Ụlọọrụ Uk Guardian wepụtara akụkọ mgbe Biodun kwuru na ndị ji egbe bịara n'ụlọ ya magide ya itinye aka n'akwụkwọ sị na ọ tụrụ asị megide Fatoyinbo n'ime ebubo ịwakpo ya.
Dakolo kwuru n'akụkọ a si n'aka UK Guardian na-efegharị mere n'izuụka abụọ gara aga.
Ọ gara n'ihu kwuo na nke ahụ abụghị eziokwu na akwụkwọ gbara megide Fatiyinbo ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe nakwa ndị uweojii.
Fatoyinbo asaala Busola n'ebubo ịwakpo ya:
Ụkọchukwu ụka Commonwealth of Zion Assembly (COZA) bụ Biodun Fatoyinbo asaala Busola Dakoloa n'ebubo na ọ wakporo ya n'ike oge ọ bụ nwata nwaanyị.
N'akwụkwọ ozi Fatoyinbo wepụtara na Instagram ya, o kwuru na " Kemgbe ụwa m, awakpobeghị mmadụ ọbụladị mgbe m ka bụ onye ekweghị ekwe."
Fatoyinbo gara n'ihu kwuo na ya agwala ndị ọkaiwu ya ka ha wepụ okwu ahụ n'ụlọikpe.
Igwe okwu ịntanet nwuru ọkụ dịka ọrịakụ Dakolo boro ebubo na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ YNaija nwere na Pastọ Biodun Fatoyinbo bụ onyeisi nchụaja a ma ama wakporo ya n'ike oge ọ bụ nwata nwaagbọghọ.
Ndị a na-anụ aha ha na-ezigara nwaanyị ahụ bụ onye na-ese photo ozi nkwado na itiaka n'obi dịka akụkọ ahụ kpalitere nnukwu ndọrịtaụka na soshal midia.
Ndị uweojii Naijira kwuburu na ha amaghị ihe ọbụla banyere ebubo nke nwunye Timi Dakolo bụ Busola Dakolo boro Pastọ Fatoyinbo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Anjuguri Manza kwuru na ọnwebeghị onye pụtara nye mkpesa maka ụdị ihe ahụ.
Ọ sị, "Anyị amaghị maka okwu ahụ. Ọ bụrụ na o nwere onye ọbụla nwere okwu, onye ahụ pụta nye mkpesa ka anyị were tinye anya na ya".
Manza gara n'ihu kwuo na ndị uweojii agaghị eme ihe ọbụla belụsọ ma agbasoro ụzọ kwesịrị ka agbaso.
Onye Ntakụkọ BBC Pidgin gara n'ogige ụlọụka ahụ n'Abuja ebe elekere iri na otu ụbọchị Fraide iji nụta olu ha.
E kweghị ka onye ntaakụkọ anyị bata, kama a gwwara ya na ọ bụ naanị ụbọchị Tuuzde na ụbọchị ụka ka mmadụ nwere ike ịbata n'ogige ahụ.
Ndị ụlọụka ahụ gwara ya weta akwụkwọ ozi sitere n'aka ụlọọrụ BBC na ha ga-asa ya.
Akụkọ ga-amasị gi: