You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ịchụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ n'ọrụ ezughi -ICPC
Kọmishọn na-ahụ maka ihe gbasara mpụ na mmehie dị icheiche ekwuola na ha anabataghị ọchụchụ achụrụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ ya na mahadum Obafemi Awolowo.
Ha kwuru site n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka agụakwụkwọ ha bụ Mohammed Bade na mahadum ahụ kwesiri ị nyocha ọkammụta Richard Akindele maka akụkọ a.
O si "N'agbanyeghị na mahadum achụọla ya (Akindele) n'ọrụ, anyị na-atụ anya na a ga-eme ya nyocha zuru oke ma kpụpụ ya ụlọịkpe maka nke a".
Bade kwuru na ọ dị mkpa iji chekwa ụmụnwaanyị na-agụ akwụkọw na mahadum dị icheiche n'ihi na ụdị omume a buru ibu n'etiti ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ mahadum.
Ọkammụta Richard Akindele bụ bu onyenkuzi na mahadum Obafemi Awolowo chọrọ idina nwataakwụkwọ ya tupu ọ gafe ule.
Achụrụ ọkammuta ahụ n'ọrụ mgbe mahadum ya mere nyocha chọpụta na nwata akwụkọ ahụ gafere ule ya ma jide kwa olu ọkammụta ahụ mgbe ọ na-agwa ya na ọ ga-edina ya.