OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọkachasị ụmụnwaanyị etoola Obafemi Awolowo University,(OAU) Ile-Ife dị n'Ọsun steeti maka ụgbọ nwamkpi ha gbara onye nkuzi ha bụ Prof Richard Akindele maka ebubo ịchọ idina nwaakwụkwọ ya iji nyere ya aka igafee ule.

Mkparịtaụka ha na onye ntakụkọ BBC nwere, ha kwuru na ntarahahụghụ ahụ enyere onye ahụ ga-akuziri ndị ọzọ ihe.

N'okwu ya Esther Okoro, onye bụ nwakwụkwọ na University of Port-Harcourt kwuru, "O bụ ihe dị mma."

Okoro kwuru na 'Ana m anụ ya na akụkọ. Ụdị ihe a emebeghị. O nwebeghị onye mma o mere."

Ụfọdụ kwuru ka ndị isi mmahadum tinyere ndị nkuzi ọzọ anya iji kwụsị mpụ a.

Cheta na ụbọchị Wenesde, onyeisi mahadum OAU bụ Eyitope Ogunbodede kwupụtara na mahadum ahụ achụọla onye nkụzi ha bụ Prof Richard Akindele maka ịrịọ nwaakwụkwọ ya ndina iji mee ka ọ gafee n'ule.

Ogunbodede kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, kwuru na bọdụ mahadum ahụ mara Akindele ikpe n'ebubo niile e boro ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na mahadum ahụ ewepụtala atụmatụ ịhụ na ekpochapụrụ nsogbụ ndịna maka ịgafe ule kpamkpam.

OAU tinyere ọnụ n'okwu ahụ ka otu nwaakwụkwọ ha zipụchara ozi dị n'igwe e ji amịta okwu (recorded audio) na soshal midia nke gosipụtara olu Akindele ka ọ na-amanye ya ka ya na ya dina iji gafee ya ule.

Mahadum ahụ họpụtara kọmitii ga-etinye anya n'okwu ahụ ma kwe nkwa inye ọnye ọbụla ikpe mara ntaramahụhụ.

Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-eto mahadum ahụ n'igwe Twitter maka ịchụ onyenkuzi ha maka ihe o mere.

Onye kpọrọ onwe ya Bionerd, kwuru na nke a ga-akụziri ndị ọzọ ihe.

Dr Dipo Awojide kwuru na nke a gosiri ọganihu.