You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Justice for Uwa and Jennifer: Ihe na-ebute mmadụ iwakpo ibe ya n'ike
Mgbe niile ka a na-anụta akụkọ maka mmadụ iwakpo mmadụ ibe ya. Nke mere nsonso a bụ nke nwata nwaanyị ụmụnwoke ise dịnara n'ike na Kaduna steeti.
Agwa dị etụ a jọgburu udele ma sigbuo nkapị.
Mana ka ajụ godi, gịnị na-eme ka mmadụ nwee uche idina mmadụ ibe ya n'ike?
Ọkaiwu bụ Titilola Vivour Adeniyi onye na-alụ ọgụ megide idina mmadụ n'ike na mmegide mmadụ maka okike (Gender) kọwara anyị ihe nwere ike ibute ya.
Ihe nyocha gosipụtara
Titilola Vivour Adeniyi kọwara na nyocha nke ya na ngalaba na-ahụ maka mgbanwe mmadụ bụ Nigerian Correction Services (NCS) nke Legọs Steeti n'afọ 2016 gosipụtara ọtụtụ ihe.
Adeniyi sị na otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ na passentị 80.5% n'ime mmadụ otu narị na iri anọ ndị nọ na nga maka idina mmadụ n'ike kwuru na ndị ọzọ dina kwara ha n'ike mgbe ha erubeghị afọ isii.
Etu mmadụ sị too nwereike ibute ya idina mmadu n'ike
Ntọala agwa mmadụ na-esikarị na ihe mmadụ mụtara oge ọ bụ nwata. Nke a na-akọwa na ọtụtụ ndị na awakpo mmadị n'ike na-esitekarị n'ọzụzụ na ezighị ezi.
Adeniyi gwara anyị ụfọdụ ihe na-ebute ka mmadụ nwee uche maọbụ ike idina mmadụ n'ike.
1) Adeniyi kwuru na ụmụaka ibido na nwata na-ele ihe onyonyo na-egosi mmekọ nwoke na nwaanyị nke bekee na-akpọ "pornography" , egwu na-agụ maka nke a maọbụ ihe ọbụla na-egosipụta ihe dị etu a nwere ike ị nwe uche idina mmadụ n'ike.
2) Ụfọdụ mgbe, ndị etinyere ụmụaka n'aka ka ha lekọta ha na-awakpo ha ụfọdụ mgbe. Nke na-enye ụmụịaka nghọtahe maka mmekọ nwoke na nwaanyị.
3) O kwukwara na ọzọ bụkwa ụmụaka ha na nne na nna ha bi n'ofu ọnụ ụlọ nwere ike ị na-ahụ ebe nne na nna ha na-eme mmekọ.
4) Nke a nwere ike ime ka ụmụaka a mee ihe ha hụrụ na-agbanyeghị na ha enweghị nghọta maka ya.
5) Ebe na oge mmadụ nọ nwereike ibutere ya ọdachị mwakpo, dịka ị nọ n'ebe dara jụụ nke ukwu naanị gị. Nke a nwereike inye onye na-ede gị ohere ịwakpo gị makana ọ ma na o nweghị onye ga-agbatara gị ọsọ enyemaka.
Ọrụ dịịrị ezinụlọ maka okwu a
Adeniyi kọwara na ọ bụ ezinụlọ bụ ebe mbụ mmadụ na-enwe ọzụzụ na ndụ ya.
Ọ kọwara na ọ bụ ezinụlọ ka ọ dịrị ikuziri ọkachasị nwa nwoke isopụrụ ma kwanyere ụmụnwanyị ugwu dịrị ha.
O kwuru sị "Anyi kwesiri ịgbanwe etu anyị si azụ ụmụnwoke, ekwesiri ị nye ha oke nke ha n'ọrụ ụlọ ma ndị nna cheta kwa na ụmụ ha nwoke na-ele ha anya etu ha sị akpaso nwunye ha agwa".
Adeniyi kwuru na ọ dị njọ ikuziri nwa nwoke na nwata nwaanyị enweghị ohere ị bu ihe ọ chọrọ i bụ n'ụwa.
Ọ kọwara na nwata nwoke nwere udịrị uche a, agaghị enye nwaanyị nsọpụrụ.
Dịka Adeniyi sị kọwaa na ọ bụrụ na ezinụlo azụghị nwa nwoke ọfụma, na ha nwere ike i soro ndị enyi ha mee ihe na-ezịghị ezi.
Ihe nwereike igosi onye nwereike idina mmadu n'ike
Titilola Adeniyi kọwara na osiri ike ịmata mgbe mmadụ ga-achọ idina mmadụ ibe ya n'ike, kama enwere ụfọdụ njirimara nke mmadụ ga-ahụ were gbaa ọsọ.
Ụfọdụ njirimara ndị a gụnyere:
- Nwoke na-enweghị nsọpụrụ ebe ụmụnwaanyị nọ nwereike idina nwaanyị n'ike.
- Ọtụtụ mgbe ihe mmadụ na-ekwu ga egosi na ọ naghị asọpụrụ maọbụ kwanyere ụmụnwaanyị ugwu.Adeniyi kwuru sị "nwoke na-ekwu na ọ bụ ihe nwata nwaanyị yi mere eji dịna ya n'ike na-egosi na ọ nweghị ugwu ebe ụmụ nwaanyị nọ".
Ụfọdụ bụ ndị kwenyere na ọ bụrụ na ha zụtara nwaanyị ihe na nwaanyị ahụ ji ha ụgwọ ndịna, ndị di etụ a nwere ike idina nwaanyị n'ike.
- O kwuru sị " Ihe kacha mkpa bụ na nwanyị kwesiri ikweta tupu nwoke edina ya, ma nwaanyị ahụ ekweghị nke a bụ idina n'ike".