Sex for Grades: Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Mahadum Rivas Steeti akara ekwentị maka mkpesa

Mahadum Rivas Steeti ewepụtala akara ekwentị ebe ụmụakwụkwọ ga-eme mkpesa maka ndị nkuzi na-achọ idina ha.

Nke a na-abịa n'ime ụbọchị atọ BBC wepụtara akụkọ maka nyocha ndị nkuzi mahadum na-edina ụmụakwụkwọ na mpaghara Afrịka (Mahadum Legọs na Gana).

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi mahadum a bụ Ọkammụta Opuenebo Binya Owei gwara BBC na ọ bụ ka ụmụakwụkwọ nwee ike ịkpọpụta ndị nkuzi na-akpa ụdị arụ a.

Ọ sị na ihe mere o ji bụrụ ihe nzuzo bụ ka ụmụakwụkwọ ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ha kpọọ onye nkuzi aha.

Mahadum a so na dị a kpọrọ aha na soshal midia ka e nyocha ndị nkuzi ha maka idina ụmụakwụkwọ.

Buhari na Jonathan Zutere n'Aso Rock taa:

Ihụkwara Foto Onyeisiala Muhammadu Buhari na Goodluck Jonathan ebe ha na-ekwe n'aka na-achị ọchị n'Asọ Rock.

Nke a mere mgbe Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa nyefere Buharị ọchịchị n'aka gara n'isi ọchịchị Naịjirịa dị n'Abuja.

O nweghi onye mara ihe bụ isi mkparịtaụka ime ụlọ ha mere were nkeji iri dịka Jonathan.

Nke a butere ọtụtụ okwu na soshal midia nke otu onye na Facebook sị na 'ọ dịka Jonathan ọ chọwala ịbanye APC'.

Na Sudan

Nwada Neemat Abdulllah abụrụla onyeisi ọkaikpe nwaanyị mbụ na Sudan

Ọ dịla anya ọtụtụ mmadụ na-achọ ka e nyekwuo ụmụnwaanyị ọkwa dị elu na mba ahụ.

Nkeji

Ihe nkiri

'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia

Dịka Mercy Eke, onye e ji Lamborghini wee mara nwetachara mmeri n'egwuregwu Big Brother Naija, okwu gbasara ihe nrite e nyere ya ka na-ewu na sosha midia.

Mercy ritere ego dị nde naịra iri atọ na ihe nrite ndị ọzọ ọnụ ego ha ga-erukwa nde naịra iri atọ.

Otu n'ime ihe nrite ndị a bụ ụgbọala Innoson Motors.

Mana otu onye a ma ama na soshal midia bụ Tunde Ednot kwuru na Innoson Motors e bunyere Mercy ekwesighị ekwesị.

Ednut kwuru na ya che na a ga-ebunye Mercy ụgbọala 'G-wagon' maọbụ 'Range'.

Mana Ednut mechara wepu ihe ahụ o dere n'akara 'intsgram' ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe ahụ Ednut kwuru.

Ha sịrị na ọ magburu onwe ya bụ ụgbọala Innoson Motors e bunyere Mercy n'ihi na ọ ga-enye aka ịịkwalite ụgbọala a rụrụ na Naịjirịa.

Mana ụfọdụ na-ekwu na ụgbọala ahụ erughị nde naịra iri abụọ na ise bụ ego ole ndị BBNaija kwuru na ha zụrụ ya.

Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru:

@DrJoeAbah kwuru na ọ zụrụ ụgbọala Innoson n'ihi na ọ dị mma.

@realVirusMedia kwuru na ọdịghị ya ka ụgbọala ahụ e bunyere Mercy eruru ego ole e kwuru na a zụrụ ya.

@youngsam_my kwuru na ụgbọala Innoson Motors zuru ka e mee.

Ụlọọrụ Innoson Motors tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ.

He kwuru na ha na-agba mbọ ịkawanye mma dị oge na-aga.

N'akụkọ ọzọ

Dịka BBC gbachara ndị nkuzi mahadum na-achọ idina ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị n'anwụ, ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itule iwu ọhụrụ ga-eme ka onye ọbụla mere ụdị omume ahụ ọzọ gaa nga afọ ise.

Onye na-akwado iwu a bụ Ovie Omo-Agege onye bụ osote onyeisi Senate ma bụrụkwa sịnetọ na-anọchite anya Delta Central n'ụlọomeiwu ukwu.

N'ofesi

Ụlọikpe na mba Tunisia atọhapụla Nabil Karoui bụ onye so azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ ụbọchị ụka.

Karoui nobu na mkpọrọ n'ihi ebubo nrụrụaka na iji aghụghọ zere ịtụ ụtụisi, mana ọ na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha.

N'egwuregwu

Ndị otu egwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghị afọ iri na asaa agawala mba Brazil iji sonye n'asọmpi iko mba ụwa maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa.

Asọmpi a ga-ebiri ọkụ bido n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba ruo abalị iri na asaaa nke ọnwa Novemba.

Naịjirịa abuola iko mba ụwa ndị na-erubeghị afọ iri na asaa ugboro ise.

Ha gunyere nke afọ 1985, 1993, 2007, 2013, na 2015.

Naịjirịa, Họngarị, Ekuadọ na Ọstrelia nọ n'ọtu B n'asọmpi nke afọ a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: