You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tacha: A kụpịala Tacha ka ya na Mercy lụchara ọgụ
A chụọla Tacha n'ụlọ Big Brother ka ya na Mercy kọchara ọnụ n'ụlọ Big Brother Naija n'ụbọchị Fraịde.
Iwu e tiri n'egwuregwu BBNaija bụ na onye ọbụla kpara ibe ya aka n'ahụ ga-alarịrị.
Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka a chụpụ Tacha n'ihi na ọ dọrọ Mercy aka na ntutu isi mgbe ha abụọ kọrọ ọnụ n'ehihie Fraịde.
Mana ụfọdụ che na agaghị achụpụ ya n'ihi na o nwere ọtụtụ ndị nkwado.
Lee ihe ndị mmadu kwuru maka #Tacha, #BBNaija19, #BigBrotherNaija, #BBNaijaEviction na nchụpụ a chụpụrụ Tacha n'abalị a:
@MaziIbe_ kwuru na:
@Zaddy_nomso kwuru na ọbụ ugbua ka egwuregwu Big Brother malitere.
@Icmuha kwuru na onweghị onye ọ ga-ewute maka nchụpụ a chụpụrụ Tacha.
@PoojaMedia kwuru na nchụpụ Tacha bụ ikpe ziri ezi.
Mana obi adịghị ndị na-akwado ya mma, dịka onye a:
Ihe niile a mere wutere Tacha nke mere o ji wee rịọ ka ndị mmadụ gbaghara ya n'agwa ọjọọ niile ọ kpara n'ụlọ Big Brother Naịja.
O mere nke a site n'akara Instagram ya bụ ebe o kelere mmadụ niile dọnyere ugwu n'oge ọ n'ime ụlọ a.
Akụkọ ga-amasị gị: