You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Omoyele Sowore: Ezekwesili agwala gọọmenti ka ha hapụ ya ọsọ ọso
Hapụ Sowore ugbụa maọbụ...
Dịka ụmụ Naịjirịa bu ngagharịiwe gaa n'ụlkọọrụ 'Human Right Commission', nwaada Igbo bụ Obiageli Ezekwesili esorola kpọkuo gọọmenti etiti ka ha were ọsọ were ije tọhapụ Omoyele Sowore bụ onye ụlọikpe nyegoro ikike ka a tọhapụ kamgbe Tuzde.
Ezekwesili bụ onye kwuru nke a n'akara Twitter taa bụ Frịade sị onye aṅakwala gọọmenti ntị maka ihe ọbụla ha ga-asị na ọ bụ ya gbochiri ha ime ihe ụlọikpe nyere n'iwu ma taa gachaa.
Ezekwesili sị na gọọmentị Naịjirịa achọghị mgbagha n'ụdi ọbụla ma kwukwaa na ha na-elutu iwu obodo a anya nke bụ na ha anaghị agbanye otu ya bụ iwu Naịjirịa siri kee ọrụ.
Ntuliaka oche gọvanọ na Bayelsa
Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjiria bụ 'Independent National Electoral Commission' ewepụtala ozi otu a ga-esi mee ntuliaka maka oche gọvanọ na steeti Bayelsa nakwa Kogi.
Ntuliaka na steeti abụọ a ga-adị n'ọnwa Nọvemba afọ a.
Otu ndọrọndọrọ 45 ga-eso sọọ mpi ịmata onye ga-ewepụta gọvanọ na Bayelsa.
Na Kogi, otu ndọrọndọrọ 23 ga-achịpụ ya.
Olile anya maka ọdọụgbọelụ Anambra steeti
Ndị Anambra steeti nọ n'ọṅụ mgbe ha nụrụ na Gọvanọ Obiano tinyere ijeri Naịra isii maka iji rụọ ọdọụgbọelu nke ga-aba ụgbọelụ ofesi na steeti ahụ.
Dịka atụmatụ Obiano si dị, a tụru anya na ọdọụgbọelụ ahụ ga-adị n'Umueri nke didebere Awka.
Ọ gụpụtara ya bụ bọjet n'ụlọomeiwu steeti ahụ ụnyahụ bụ Tọzde 2019.
Iran atọhapụla ụgbọmmiri bụ ọkọlọtọ mba Briten
Mba Iran atọhapụla ụgbọmmiri bu ọkọlọtọ ndị Briten ha ji kemgbe ọnwa abụọ gara aga.
Cheta na ejidere Stena Bulk izu abụọ ka Royal Marine jidechere ụgbọmmiri ndị Iran na akụkụ Gibraltar.
Iran ka na-ekwusi ike na ọ bụghị ọbọ ka bọrọ.
'IAAF World Athletic Championship' ebirila ọkụ
Asọmpị World Athelic Championship amalite taa bụ Fraịde na Doha, isi obodo Kataa.
Ndị na-ahazi asọmpị a bụ otu 'International Association of Athletics Federations' (IAAF).
Ka o si gbata kwụrụ ugbua, Christain Coleman, Justin Gatlin, Zharnel Hughes na Adam Gemili eruola agba nke osote nke ikpeazụ n'ọsọ nke ụmụnwoke nke mita narị.
Gee akụkọ ndị a niile na nkeji
Ndị oweojii atọhapụla ndị a n'agbụ
Ndị uweojii nke mpaghara ugwu nke Naijirịa enyochapụtala ụlọ mkpagbu na ntaramahụhụ ndị mmadụ ruru 500 dị na mpaghara Rigasa nke Kaduna steeti.
Onyeisi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Ali Janga gwara BBC na ọ bụ onye ọgba ama gwara ha maka ụlọ mkpagbu a.
Ọ kwuru na ọ bụ ụbochi tụzde ka ndị uweojii wuchiri ebe ahu.
Janga kwuru na ha hụrụ ihe ruru ụmụnwoke nari ise nke ọtụtu n'ime ha bụ ụmụaka nọ n'ime ụlọ ahụ.
Ụfọdu n'ime ndị ahụrụ n'ụlọ ahụ bu ịgịga n'ụkwụ ebe ụfọdu bụ ndị awakporo n'ike.
Maazị Janga kwuru na ha amatachabeghi etu ụmụ nwoke ndị ahụ siri rute n'ụlọ ahụ kama ụfọdụ si na ọ bụ nne na nna ha kpọtara ebe ahụ maka ọmụmụ ofufe Alakuba.
Ndị uweojii na-ekwu na onweghi ihe gosiri na-ebe ahụ bụ ụlọakwụkwọ.
Dịka ọdị ugbua, akpọpụla ụmụ nwoke ndị a.
Ụfodụ n'ime ha bu apa na ọnya.
Aka ndị uweojii akparala mmadụ asatọ gbasara mkpamkpa a.
Ndị uweoji sị na ha ka na-eme nyocha, ma kwukwa na ha mecha ha ga-akpọpụ ndị mere ihe a ụloikpe.
Ebe ọzọ na mpaghara ugwu
Ogbunigwe adọrọ n'okporoụzọ egbuola mmadụ isii n'obodo Kamuya dị na Borno steeti mgbe ha na-eme njem.
A na-eche na ọ bụ otu ndị na-eyi ndụ egwu na mpaghara ahụ kpọrọ onwe ha ISWAP kpara mkpa mkpa a.
Mugabe enwetala ebe ezumike ya
Ezinaụlọ aka chiburu mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe emeriela ndọrọndọrọ maka ebe a ga-eli ya.
Cheta na gọọmentị mba ahụ chọrọ ka elie ya ebe a na-eli ndị dike mba ahụ ebe ezinaụlọ ya chọrọ ka elie ya ebe eliri ndị nna nna ya.
N'egwuregwu,
Otu Slavia Prague nke Czech Republic ezigarala onye ọgba bọọlụ ha bụ Peter Olayinka ozi ekele dịka Gernot Rohr họpụtara ya na ndị ga-eso gbara Naịjirịa bọọlụ n'asọmpị enyi na enyi ha na mba Brazil na-akwado ịgba.