Boko Haram: Ndị agha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị Agha Naijirịa anwuchiela Alhaji Bukar Modu e ji Modu China bụ onyeisi ọkwọ ụgbọala ndị Boko Haram.

Bukar Modu bụ onye nke iri asatọ na itolu n'ime ndị oyi egwu nke ndị agha Naijirịa deputara a na-acho achọ.

Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka e jidere Modu na ndị Boko Haram itolu ọzọ.

Ndị agha Naijirịa depụtara nke a n'igwe twitter ha.

Akụkọ ga-amasị g

Ihe Nkiri ga-amasị g