You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu: Ọkaikpe abiaghị ụlọikpe
Ọkaikpe Jọstịs Binta Nyako bụ onye nọ n'isi ikpe Nnamdi Kanu abịaghị ụlọikpe ukwu nke etiti dị n'Abuja taa.
N'abalị 23 nke ọnwa Maach, Jọstịs Nyako nyeburu iwu ka anwụchie Kanu maka ịjụ ịpụta n'ụlọikpe kemgbe April 25, afọ 2017 na-enweghị nkọwa doro anya.
O higharịrị ikpe ahụ ruo ụbọchị June 18 mana Jọstịs Nyako bụ onye nọ n'isi abịaghị ụlọikpe n'ihi 'na ahụ adịghị ya.'
Ndị ọkaiwu abụọ; ma ndị na-anọchite gọọmenti ma ndị na-anọchite Kanu, na ndị ọrụ ụlọikpe (court registrar) tụkọtara isi ọnụ ma nwe nkwekọrịta, were higharịa ikpe ahụ n'abalị 31 n'ọnwa Ọktoba, afọ 2019.
Dịka nke a na-eme, o doro ewu na ọkụkọ anya na Nnamdi Kanu anaghị arọ nrọ ịbịa ụlọikpe maka okwu ahụ.
Ozi o wepụtara n'igwe Twitter ya gosiri na ọ nọ mba Amerịka ebe ya na ndị otu ya na-enwe nzukọ dị icheiche gbasara nnwereonwe Biafra.
N'aka nke ọzọ, Nnamdi Kanu etiela mkpu si na ndị Fulani ekwojuola Alaigbo na-eche ka e nye ha iwu ịkpa mkpamkpa n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Kanu, onye kwuru nke n'ozi ọ gbasara n'abali Juun 18, afọ 2019 riọrọ Chineke ka onye ndi otu ya amamihe ịtụpụta ụzọ mgbapụ na nsogbu ahụ ahụ.
Cheta na a na-ekpe Kanu bụ onye ndu otu na-achọ nwereonweonye Biafra ikpe maka ebubo mpu megidere Naijiria.