You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe sị Abaribe kpọpụta Nnamdi Kanu
Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya enyela iwu ka Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ kpọpụta Nnamdị Kanu n'ụlọikpe mgbe a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa June ma ọ bụ ha aga mkpọrọ.
Abaribe, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ El-shalom na otu onye bi na Abuja bụ Tochukwu Uchendu gbaara Nnamdi Kanu akaebe e jiri tọpụ ya n'ụlọmkpọrọ.
Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegidee ọchịchị ala Naijiria bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Septemba, afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ha oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ahụ.
Ka ebulitere ikpe ahụ, ọka iwu na ekpechitere ndị ahụ bụ Chukwuma Machukwu Umeh, kwuru na enyebeghị ha akwụkwọ ụlọikpe nke kwupụtara iw ọkụ ahụ onye ọkaikpe nyere.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Gere akụkọ mere ụnyaahụ n'otu nkeji
Ihe nkiri
Na Facebook Live, anyị kpara maka ịdamba ntuliaka ji ndị Igbo nke bekee kpọrọ voter's apathy.