You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enwe achụpụla ndị mmadụ na Soluyi/Sosanya dị na Legọs
"Ị zụta ngwa nri dowe n'ụlọ gị, ị bata n'ụlọ otu ụbọchị ị hụ ka nri gị kwasara n'ala, ọ bụrụ na enwe akụwaala mpio gị, bata zuru nri gị." Ihe a bụ ihe ụfọdụ ndị na-ahụ na Legọs.
Otu onye bi na Sosanya, Gbagada dị na Legọs, bụ Gabriel Wopariwa, gwara BBC Pidgin na "enwe na-enye anyị oke nsogbu".
O kwuru sị "ọ bụrụ na ị debe nri gị n'ụlọ ma ị mechighị ọnụụzọ gị nkeọma, etu a ka enwe ga-esi bata richaa nri ị dowere."
Akụkọ ga-amasị gị:
Wopariwa kwuru sị na ụfọdụ n'ime ha agabuola mkpesa na gọọmentị ime obodo Kosofe, mana onweghị ihe ha gatara.
Ndị agbataobi ahụ na-arịọ ndị gọọmentị ka ha gbalịa chụpụ enwe ndị a maka na ha na-awakpozi ndị mmadụ ugbua.
Ha kwuru na otu enwe busoro otu nwoke agha mere ka ebuga nwoke ahụ ụlọọgwụ, n'ihi na nwoke ahụ chụrụ ya ọsọ ka ọ chọrọ izuru akịbekee ya.
Ichie Akin Adedoyin kwuru na o biela na Soluyi kamgbe afọ 1985.
O kwuru na oge ebe ahụ bụ ime obodo enwe ndị a bi n'ime ọhịa, na ha-anaghị enweta mkpesa ọbụla, mana ugbua obodo ahụ bidoro imepe, ha enwetela mkpesa karịrị akarị.
Ha kwukwara na o nwere otu nwoke bi ebe ahụ enwe ndị a na-agbakọ n'ụlọ ya, mere ha ji na-enyo ma ọ na-azụ ha azụ.
Onye ọzọ bi n'agbataobi ahụ bụ Joshua Okeke, kwuru na ọ na-eche na enwe ndị ahụ nwere ike ịbụ mmadụ maka etu ha si ahazi onwe ha.
O kwuru sị na itinyegodiri ha nsị na nri debe, ha agaghị eri ya.
O kwuru sị na enwe ndị ahụ anaghị achọ ụmụaka okwu, na ha na-egwusa ha egwuregwu, mana ha na-aba ndị okenye ọgụ.
Ndị agbataobi Sosanya kwuru na enwe ndị a na-apụta site n'elekere isii ruo asatọ nke ụtụtụ, ma pụtakwa n'elekere ise nke mgbede oge ha na-ebido ịchọ nri.
Ụjọ na-atụ ha ka enwe ndị a ebunyela ha ọrịa.