You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-enyere APC aka karịa PDP - Felix Okafor
Onye ọkacha n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Felix Okafor akọwala etu mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-eji emetụta ndị Igbo n'afọ 2019.
Mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ banyere uche ya na mpụtagharị Nnamdi Kanu, o kwuru na nke a agaghị enyere ndị Igbo aka.
O kwuru na ọ gaghị enyere ndị Igbo aka i nweta ọkwa osote onyeisiala maọbụ onyeisiala n'ihi na Kanu na ndị otu ya ekwenyeghi na Naịjirịa.
N'okwu ya "Nnamdi Kanu ekweghi na Naịjirịa bụ obodo, ọ na-akpọ Naịjirịa obodo ụmụanụmanụ
O kwuru na Kanu ekweghị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa ka ọfọduzie Igbo ịbụ osote onyeisiala.
Okafor gara n'ihu kwuo na mpụta Nnamdi ga-eme ka ndị mmadụ tụọ Atiku egwu na ọ wepụtara onye Igbo ga-eme ka-akpọ ganị ganị imegide Naịjirịa.
" Mpụtagharị Nnamdi Kanu agaghị enyere PDP aka, kama ọ bụ APC ka ọ ga-enyere aka", Okafor kwuru.