You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedu ebe Nnamdi Kanu nọ? Ihe Geoffrey Onyeama kwuru
Onye ntaakụkọ aha ya bụ Simon Ateba na arụ ọru na ulo ntaakụkọ Today News Afrịka jụrụ Geoffrey Onyeama maka onọdu Nnamdị Kanu n'ime ajụju ndị ọzọ ọ jụrụ.
Mgbe Maazị Onyeama tinyere ọnụ na ya bụ okwu, ọ gaghị i'ihu saa ya etu esi juo ya.
Ọ sị na ya gụrụ akụkọ n'ụtụtụ ahụ ebe onye bụbụ gọvanọ Imo steeti bụ Orji Uzọ Kalu kwuru na Maazi Kanu nọ na Briten na-ezu ike.
Maazi Onyeama nwere ịza ajụjụ ahụ mee ihe ọchị mgbe ọ sị ka ndị ntaakụkọ ekwukwana na ya kwuru makana ọbụghi ya kwuru.
Cheta na Kemgbe afo gara aga ebe Nnamdi Kanu nọ bụ ihe ọtụtụ mmadu na-acho ịmata.
Onwere ndị na-asị na ọ nọ n'ime ụgbọmmiri, nwekwa ndị sị na ọ nala mmụọ, ka ndị ọzọ, dịka Orji Kalu, na-ekwu na ọ na mba Briten, bụ ebe onwere akwụkwọ dịka nwaafọ.
Ndịagha Naịjirịa, bụ ndị ndị Ipob (otu Kanu) na-ebo na ọ bụ ha ma ihe mere nwa Amadị a, na-ago aka na ukwu na ha amaghị ọnọdị ya.
BBC Igbo jụrụ nwunye Kanu ma ọ ma ebe di ya nọ mgbe ụlọ ntaakụkọ a na ya nwere mkparịtaụka, lee ihe okwuru ebe a:
Gọọmentị Naịjirịa sakwara ebubo nwunye Kanu boro ha na aka ha dị n'ihe mere di ya mgbe Lai Mohammed gwara ndi ntaakụkọ BBC na 'nwunye Kanụ na-arọ nrọ'.