Osun 2018: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ na-azụ vootu

Ndị uweoji ekwuola na ha nwụchiri ụmụnwoke abụọ bụ ndị echere na ha na-ego votu na ntuliaka ahụ.

Ndị uweojii kwukwara na ha jidere ha ebe ha ji ego karịrị narị puku isii ma bidokwa nyocha.

Amabeghi otu ndọrọndọrọ bụ ndị dupuru ha n'ọrụ a rue ugbua.

Cheta na ndị ntaakụkọ BBC nọ n'Osun steeti na-ekwu na igwe mmadụ pụtara ya bụ ntuliaka.

Ha kwukwara na ndi ọrụ nchekwa dị icheiche pụtara n'uju ha nke gụnyere ndị agha, ndị uweojii, ndịọrụ 'civil defence' ma ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

Mmadụ iri anọ pụtara ịzọ ọkwa Gọvanọ Osun steeti ahụ.

Ademola Adeleke ama dịka 'dancing senator' pụtara tunye votu ya. Adeleke nọchịrị anya PDP na ya bụ ntụlịaka.

Ibe ya bụ Isiaka Oyetola nke na-anọchi anya APC atụọla votu ya.

Igwe mmadụ pụtara ịtunye votu ha.

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị pụtara ịkwado ibe ha.

Anaghị eji afọ egwu egwu dịka ndị pụtara ịtụ votu na-ego ihe oriri.

Akụkọ ga-amasị gị