Udeh Chiamaka Victoria: Ihe mere m ji fee ọkọlọtọ Naijiria bu ọbara

Udeh Chiamaka Victoria, nwada Igbo nọchitere Naijiria n'asọmpi 'Miss Africa Russia' ekwuola na ihe mere o ji ọkọlọtọ Naịjirịa ọbara gburu bụ iji chetere ụwa ihe mere na Lekk Toll Gate Legọsị n'abali iri abụọ nke ọnwa Oktoba afọ 2020 nakwa iji rụtụ aka n'etu ọnọdụ nchekwa sị kwuru ugbua na Naijiria.

Nwada Chiamaka Ude, onye Anambara steeti wuru ewu na soshal midia abali ole na ole gara aga dịka onyonyo ebe o fere ọkọlọtọ Naijiria bu ọbara n'asọmpi "Miss Africa Russia nke afọ gbara n'ịntanet.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde n'ikuku, Chiamaka, kwuru na ọ bụ isi ụwa bịa lele ihe mere ihe mere na Lekki Toll Gate n'afọ 2020, ọnọdụ oke ogbugbu mmadụ na ịwakpo ụmụnwaanyị na-eme na mpaghara di iche iche na Naijiria na-eri ya nri n'afọ.

"E ji ohere e nyere m iji gosi ụwa ihe na-eme na Naijiria."

"Ọ bụ iji gosi ihe mere n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Oktoba (afọ 2021) nakwa nke na-eme ugbua; aka na-egbusisi ndị mmadụ, nsogbu nchekwa ka na-aganihu.

Udeh, onye gbara ama na ya kiriri ihe mere na Lekki Toll Gate intanet butere ya nsogbu ahụike nke Bekee kpọrọ 'Post Traumatic Stress Disorder" kwuru na o nweghị onye manyere ife ya bụ ọkọlọtọ.

O kwuru na ya amaghị na ya bụ ihe onyonyo ga-ewu ewu, were gaa n'ihu sị,"Ihe mere si m n'obi. O nweghị onye gwara mee ya."

Nwada ahụ rụtụrụ aka na ọtụtụ eziterela ya ozi ịyi ya egwu maọbụ maja ya, ebe ụfọdụ na-akatọ ya mana na ya anaghị ata onwe ya ụta na ya mere ihe ya mere n'ihi na ọ bụ obi mwute kpaliitere ya.