You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fr Ejike Mbaka : Aga m agozi Nnamdi Kanu rue echi
Ụkọchukwu Katọlik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na o nweghị onye ga-akwụsị ya ịgọzị onye ọbụla ya chọrọ ịgọzị, ọbụladị Bishọpụ ya bụ Bishọpụ Callistus Onaga nke ụka Katọlik na Dayọsịs Enugwu.
N'ozi ọ gbasara ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ekpere pụrụ iche a kpọrọ "E No Dey Again" n'ogige Adoration Ministry'dị n'Emene Enugwu, Mbaka gọziri Nnamdi Kanu ọzọ sị na ọ bụ onye kwesịrị ka a gọzie.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ ya maka ịgọzi Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu ndị na-eti mkpu nnwereonwe Biafra.
Mbaka gwara Bishọpụ ya ka ọ kwụsị ịgwa ya onye ya ga-agọzi maọbụ onye ya agaghị agọzi.
Ọ sị Bishọpụ tiri uwe bishọpụ ya bụọ ya ọnụ ma ọ bụrụ na ọ chọọ.
Mbaka gara n'ihu Kaatọ Bishop Onaga maka idetara ya akwụkwọ ozi nke ọ kpọrọ "nke ekwensu."
ọ gara n'ihu katọọ Osote Bishop Enugwu bụ auxiliary Bishop of Enugu bụ onye o boro ebubo na ọ na-atụgide ya asị.
Ọ gọzịkwara ndị na-eso ya maka ịchọ ya ụbọchị akụkọ fegharịrị na-a na-achọ ya achọ, ma gochitere ha na o nweghị ihe ha bibiri.
N'okwu ebubo na ọ na-ayị otiegwu ya bụ ụlọma nke otu nwaanyị kwuru na ọ tụwara ime, Fada Mbaka gọrọ na ọ bụghị eziokwu, ma jụọ Bishopụ ya jụọ Bishọpụ ya ihe mere na ọ jụghị ndị na-ebo ya ebubo ajụjụ.
"Kemgbe afọ gaara aga ka a kọrọ akụkọ Uloma, Bishopụ ma maka ya, gba nkịtị ebe ọ makwa na ọ bụ asị. Kedụ ka ị si nye ohere ka ndị mmadụ na-akatọ ụkọchukwu gị?"
Ọ bụrụ na Bishọpụ Onaga gbara nkịtị, ọ bụ obi ọjọọ megide ụkọchukwu ya."
Ọ gara n'ihu boo Bishop Onaga na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ ebubo ịkpa nkata megide ya.
Cheta na n'ọnwa gara aga, ndị na-eso Fada Mbaka mere ngagharịiwe dịka akụkọ fegharịrị na a na-achọ ya achọ.
BBC Igbo wetara akụkọ na ihe onyonyo Facebook ka ọ na-eme ebe ndị na-eso Fada Mbaka wakporo ụlọ Bishop Onaga mebie ihe gụnyere ụgbọala, ụlọ mposi nakwa ihe ndị ọzọ.