You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Mbaka adaghị iwu site n'ịgba Buhari ụgwọ' na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ a na-ekwu
Ọtụtụ ndị mmadụ amalitela itinye ọnụ n'ọsịsa Garba Shehu nyere Fada Ejike Mbaka maka ebumnuche ya ha onyeisiala Naịjirịa kwesiri iritu n'ọkwa maọbụ ndị omeiwu achụọ ya.
Cheta na Alhaji Shehu sị na iwe Mbaka bụ maka na Buahri enyeghị ndị ọ kpọ bịa ọrụ dịka o siri chọọ.
Mana ndị ụfọdụ mmadụ na soshal midia anabataghị ihe a Alhaji Garba kwuru.
Ufọdụ na-ekwu na atụmatụ ikwu ndị gbanyere onye ndọrọndọrọ aka n'ukwu oge achụmta vootu ụgwọ bụ omenala ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Otu onye n'ime ndịa bụ Maazị Gimba Kakanda sị na Shehu kwesiri ịma na ọ bụ n'ụwa ka ndị nkwado na ndọrọndọrọ ọchịchi na-erite ụgwọ ha.
Bonario Nnags na-ajụ ebe Mbaka siri mejụọ n'ịsị gọọmentị Buhari nye ya ọrụ. Ọ sị na o nwere ndị kwadoro Buhari mechara nwete ọkwa dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdọ ụgbọmmiri bụ Hadiza Bala Usman.
Onye ji akara @nwaegbe_nkem kwuru na a ma Mbaka dịka onye ji ego achụ ego.
Onyedikachukwu Anambra na-eju ma onwere ihe dị njọ ma emee nwata ka emere ibe ya?
Mana onwere ndị dị ka aka chiburu Ekiti steeti bụ Ayo Fayose na-asị ma Mbaka, ma gọọmentị Buhari, o nweghi ndi ekwesiri ịtụpụrụ ọnụ.
Ka ọ kwụ ugbua, ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu ka na-arị elu dịka ụlọ ntaakụkọ Daily Trust dere na patị APC si na ha ga-ekpesara Pope maka emume Mbaka.
Daily Trust sị na ọ bụ osote onye ode akwụkwọ pati ahụ bụ Yekini Nabena kwuru nke n'ụbọchị Fraịde.
Ha sị na ọ sị "Ọ bụ ajọ ihe na onye ụkọchukwu, bu onye kwesiri iji ekpere egbochi ọdachị, bụ onye na-atụ gọọmentị ọha hibere aka n'anya maka ihe ọ ga-erite dịka ọ na-aghọ aghụghọ na ọ na-ekwuru ọha."