You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mbaka: Anaghị m ana ego ikpere onye ọbụla ekpere
Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya anaghị ana onye ọbụla ego iji kpere ya ekpere.
Mbaka kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde dịka onyonyo ebe ọ na-agwa Peter Obi ka ọ kpọpụta aha ego ọ ga-enye maka ịrụ ọrụ na mịnịstrị ya pụtara okwu na soshal midia.
Mana okwu o kwuru nke dịka nzaghachi ndị katọrọ ya, Mbaka kwuru sị, "Anaghị m ana ego ikpere onye ọbụla ekpere."
O kwuru na ego a na-enweta bụ iji na-enyere ndị mmadụ aka.
"Abụ m nwa ọgbụgba ndụ. Eji m ime ọgọ gbaa ndụ. Ihe ọ bụla m agahị eji mee ọgọọ ma rụọra Chukwu ọrụ abịarala m."
Mbaka dọrọ aka na ntị ka"Onye ọbụla na-akatọ nwa ọgbụgba ndụ kpachara anya ya," ka ihe mere Paul, onye apọstụl, onye siri busoro ndị na-eso Kraịst agha n'akwụkwọ nke Ndịọrụ, ghara ime ya.
Cheta na Peter Obi site n'ọnụ ọkaịwụ na-ejere ya ozi bụ Val Obienyem kwuru na ya anaghị ahụta ihe a Mbaka mere etu ndị ọzọ si ahụ ya.
O kwuru na etu ọbụla ọnọdụ ọbụla sị dị mma maọbụ dị njọ , enwere ihe mmụta nọ n'ime ya.
Ọ rịọrọ ka ndị mmadụ ghara ị kparị Fada Mbaka makana ya bụ Peter Obi anaghị ahụta ihe ọjọ ọbụla na ihe niile Mbaka kwuru ụnyahụ.
Obi kwuru na udiri onyinye na-ebute ihe nrite bụ nke e nyere Chineke na nzuzo.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia
@cassa_69 kwuru na ihe a Mbaka mere wepụrụ ugwu ya dịka onye isi n'ụlọụka
@linusNoni na-ekele Peter Obi ka o si kwụrụ chim ghara ikwe ka Mbaka Maja ya.
@ifeanyiokech kwuru na ihe a gbagojuru ya anya.
Obi rịọrọ ka ndị mmadụ tinye Mbaka n'ekpere ka Chineke duo n'ụzọ dịmma.
Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Peter Obi na Aiku Abubakar akwadoghị ụlọakụ site n'iji ego waa ọji maọbụ ego ịrụ ụlọụka na ha ga-ada na ntuliaka 2019.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: