You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Jubril: Anwụghị m anwụ, a ka kwụm chịm - Buhari
Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadụ Buhari azarala ọnụ ya n'ebubo Nnamdi Kanu boro ya na ọ nwụọla kamgbe afọ 2017.
Buhari katọọrọ ebubo a site n'okwu o kwuru mgbe ya na ndị Naịjirịa bi na obodo Krakow nke mba Poland na-akparị ụka.
Onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmad depụtara nke n'akara twitter ya;
Buhari kwuru "Ọtụtụ ndị chere na m nwụrụ n'oge m na-arịa ọrịa. Ihe a bụ mụ n'ezie."
"Aga m eme emume ncheta afọ iri asaa na isii nke ọ mụmụ m. M ka ga-adị ike."
N'aka nke ọzọ onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na onweghi mgbe ọ sịrị na a kpụrụ Buharị akpụ.
O kwuru na ọ bụ onye ọzọ a kpọrọ 'Jubrin' si na Sudan na-anọchi anya ya n'ọkwa dịka onyeisiala.
Kanu kwuru nke a na mgbasaozi ya n'igwe Radio Biafra ụnyaahụ n'iji zaghachị okwu Lai Mohammed kwuru.