Igbo Tradition: Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Nwaagbọghọ Igbo ọbụla na-amaghị ka e si etecha onwe ya dị ka nkịkara akwa n'anya ụmụagbọghọ ibe ya.

Ị chọrọ ịma agbọghọ chapụrụ achapụ, ị lee ya anya ị ga-ahụrịrị ka ahụ ya si akwọ mụrụ mụrụ maka ihe ntecha dị iche iche o jiri chọọ onwe ya mma.

Akụkọ a ga-egosi anyị ihe ntecha ole na ole ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe elu ka bụ ala ọsa.

1.Ka anyị malite n'ọtangele:

Ọtangele bụ pawụda ojii.

Ọ dị ka ihe eji unyi akwọrọ akwọ wee mee. Nke a bụ nke a na-akpanye n'anya.

Ụfọdụ na-akpọ ya tiro. Ụmụagbọghọ techaa ọtangele, anya ha a na-egbuke ka ọnwa.

2.Uri

Ihe ntecha a esi na mgbọrọgwụ enweta bara ezigbo uru n'ala Igbo makana eji ya ese eserese n'ọnụ maọbụ ụkwụ nwaanyị Igbo ọbụla ọ na-amasi.

O nwereike ite ya n'ahụ ma ọ na-eme emume alụmdi na nwunye maọbụ ọ gawa mmemme ndị ọzọ a na-eme n'ala Igbo.

E nwekwara ike iji uri dozie ụlọ maọbụ ahụ aja ụlọ mmadụ.

Mbata ozioma nke Jesu Kristi metụtara etu esi akwanyere uri ugwu maka na ndị ụka na-eche na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ.

3.Uhie

Uhie bụ pawụda na-acha uhie uhie.

A na-eji ya akwado ụfọdụ ụmụagbọghọ maka alụmdi na nwunye n'oge gboo.

E techaa nwaagbọghọ uhie a, ahụ ya a na-akwọ mụrụ mụrụ.

4. Ayọrọ Mgbaji

Nke a bụ nke ụmụagbọghọ na-anya n'ukwu ma n'olu.

Ọ na-abụ nwaagbọghọ chọọ ịlụ di, a nyanye ya n'ukwu, olu ma ụkwụ ka ndị mmadụ kiriwe mma ya.

Ọ na-achakarị uhie uhie maọbụ ọcha.

Gịnị na-emezi ugbua?

Ihe ejirila ike gbanwe ugbua dịka ihe ndị a gbara kasa.

Ọtangele, Uhie ọnụ ma ayọrọ mgbaji eyirila uwe ọhụrụ nke buzi na onye ukwu ma onye nta jizi ha eme ngala ma na-enweta ezigbo ego site n'ire ha.

Ndị ntecha mere aka ọrụ na-ekwusi ike na ọ na-agara ha ezigbo ahịa makana nnunu ichọ mma ahụ na-ebe mgbe ahụ n'etiti ụmụnwaanyị ka na-ebe ugbua.