You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị
Nrị dị nma, ịchọ nma, ego, ezumike, ụmụaka, alụmdinanwunye, mmekọrịta ha na enyi ha...ihe masịrị ụmụnwaanyị karịrị akarị.
Mana ugbua anyị ga-akọrọ unu ihe ise kachasị amasị ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị Igbo:
Ha anaghị eji ụmụ ha egwu egwu makana ezinaụlọ ha dị oke mkpa.
Ụmụaka ha bụ ihe mbụ na ndụ ha.
Ụmụnwaanyị ala Igbo bụ oriakụ na-achọ ebe ahụ ga-adị ha mma
"Ahụ chọrọ nhicha" ụmụnwaanyị adịghị achọ mmekpa ahụ.
Ha chọrọ ka ha kee ekike dị mma
Ụmụnwaanyị Igbo na-eji ejiji dị mma ọge ọbụla.
Ụmụnwaanyị ala Igbo na-achọ ụmụnwoke na-agba mbọ
Ihe ọbụla nwoke tinyere aka na ya, nwaanyị Igbo ga-akwado ya.
Ha na-achọ itinye aka n'ọrụ ogeọbụla, ha anaghị achọ ịnọ nkịtị
Ihe niile nwaanyị chọtara ime, ọ ga-eme ya ọfụma.