You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rwanda: Amụmaigwe gbagburu mmadụ iri na isii
Amụmaigwe gburu mmadụ iri na isii ma merụọ ihe karịrị mmadụ otu narị ahụ n'obodo Nyaruguru na mba Rwanda ụnyaahụ.
Ọtụtụ n'ime mmadụ iri na isii ahụ nwụrụ ozigbo ihe a mere, ebe mmadụ abụọ ọzọ nwụrụ n'ụlọọgwụ site na ahụ ha merụrụ, onyeisiobodo ahụ Habitegeko Francois gwara ụlọntaakụkọ AFP.
Dọkịta na-elekọta ndị a kwuru na n'ime mmadụ dị otu narị na iri anọ ebugara ụlọọgwụ, mmadụ atọ na-alụ ọgụ ndụ na ọnwụ.
Francois kwụrụ na amụmaigwe gbagbukwara otu nwaakwụkwo na mpaghara obodo ahụ n'ụbọchị Fraiday.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu igwe okwu:
Nyocha e mere na-akọwa na ụlọekpere ahụ enweghi ngalaba na-egbochi ọnwụ site n'amụmaigwe.
Cheta na gọọmentị Rwanda gbachiri ọtụtụ ụlọekpere maka na arụghị ha nkeọma, na ha enwekwaghị ụfọdụ ihe mgbochi kwesiri.
Ụdị ihe mberede a na-eme karị n'oge udu mmiri na obodo ndị dị na mpaghara ugwu na Rwanda.