Ihe mberede Okporo ụzọ eriela ndụ mmadụ atọ na Lagos

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Mberede okporo ụzọ mere na Lekki taa eriela isi mmadu atọ ma merụo ndị ọzọ ahụ.

Akụko si ebe ihe mere na-apụta na-akọwa na ihe mere na ebe a na-atụ ụgwọ isi ụgbọala a na-akpọ "toll gate" n'olu Bekee.

Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na otu ụgbọala nke a na-akpọ "Jeep" kụrụ ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ were merụọ ihe rụrụ mmadụ iri ahụ.

Ndị ụlọọrụ ebe "toll gate" ahụ kwuru na "jeep" ahụ na-agba n'ụzọ o kwesighi mgbe ọ kụrụ ụbọala nke ọzọ ahụ.

E buru ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị ịcheịche na Gbagada ma na Marina dị nso ebe ahụ

Lee ihe onyonyo mmadụ nọ ebe ahụ setere:

Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ na Marina kwuru na otu onye nwuru ebe mmadụ abụọ ndị nọ gbagada nwụrụ.

Ndịọzọ ruru mmadụ asaa na-alụ ọgụ ndụ na ọnwụ n'ụlọọgwụ Marina ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: