You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala mba Rwanda abụrụla onyeisi AU ọhụrụ
Onyeisiala mba Guinea enyefela ọkwa onyeisi otu mba Afịrịka a na-akpọ AU n'aha ịchafụ n'aka onyeisiala mba Rwanda bụ Paul Kagame.
Kagame kpọkọrọ ndị otu AU niile ka ha nwee ịdị n'ọtụ n'etiti ha iji we nweta mgbanwe niile ha chọrọ na mba ha n'otu n'otu nakwa dịka otu mpaghara.
N'aka nke ọzọ, onyeisiala Naịjirịa amalitela okwu gbasara isi okwu nzụkọ AU nke afọ a nke bụ ọgụ megide mpụ.
Cheta na onyeisiala Buhari hapụrụ Abuja ụbọchị 26 Jenuwarị gawa mba Etiopia ebe a na-eme ọgbakọ ahụ. Buhari bụ onyeisioche gbasara ọgụ a na-alụso mpụ na mpaghara Afịrịka.
Anyị ga na-ewetara gị akụkọ ka ọ na-aga