You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe ndị na-akpatara gị afọ mgbu, na ihe ị ga-eme maka ya
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ọtụtụ mgbe ka afọ mgbu dulara ndị mmadụ mmụọ n'ihi na ha chere na ọ bụ naanị "nwa ntakịrị afọ mgbu".
Mana ndị ọkachamara ekwuola na afọ mgbu nwere ike ịbụ ihe nrụtụ aka maka nnukwu ọrịa dị n'ahụ mmadụ nke e kwesịrị inyocha ma gwọọ kpamkpam ka onye ahụ nwere onwe ya.
Dọkịta Anigbamkpu Obinnaadigo kọwaara BBC ihe o ji dị mkpa ka onye nwere afọ mgbu gbakarịa nkịta ụsa n'ọsọ gaa ụlọọgwụ:
Apendicitis
Ihe mbụ na-egosi ọrịa 'appendicitis' bụ na otubo ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ.
Ụfụ a ga-emechaa gbadata n'akụkụ aka nri afọ onye ahụ.
Oge ụfọdụ, onye ahụ ga-enwe ahụ ọkụ, maọbụ ịnyụ anyụ, maọbụ ịgbọ agbọ.
Ọ bụrụ na ọ gaghị ụlọọgwụ n'oge, ya bụ 'appendix' nwere ike gbawaa n'ime afọ mmadụ.
Nke a mee, ọ ga-eme ka abụ jupụta n'ime afọ, oge ahụ ka afọ niile ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ.
Mana ọ bụrụ nwaanyị, njirimara orịa 'ovarian cyst' yitere njirimara 'appendicitis'.
Ya kpatara ime nnyocha n'oge ji dị mkpa.
Ọnya afọ (Gastric Ulcer)
Dkt Anigbamkpu kwuru na ọnya afọ na-emetụtakarị akụkụ ahụ dị n'etiti obi na afọ mmadụ.
Bekee na-akpọ akụkụ ahụ a 'epigastric region'.
Ihe na-akpata ọnya afọ bụ "mmiri 'acid' nke na-esi n'afọ apụta iji nye aka gbarie nri mmadụ riri".
Anigbamkpu kwuru sị: "Mgbu ọnya afọ na-adị ka ịcha ọkụ maọbụ ebe awụnyere ose n'ime ọnya."
Ihe na-eme o ji aka njọ gụnyere nri ose, ihe e ghere eghe, erighị nri n'oge, dịrị gawazie.
Naanị ndị ọkachamara n'okwu ahụike ga-ekwu ihe ga-enyere onye nwere ọrịa a aka.
Ọrịa Okwute Akịrị (Kidney Stone)
Dịka Dkt Anigbamkp si kwuo, ụfụ 'kidney stone' na-afụru na mkpụrụobi.
"Na mgbadata ngụgụ afọ nke aka nrị maọbụ nke aka ekpe ka ụfụ 'kidney stone' kacha emetụ".
"Mana ụfụ a ga-emecha dajụụọ, ọ nọkata, ọ bịakwa ọzọ."
Anịgbamkpu kwuru na 'kidney stone' abụghị ọrịa a na-ahụ kwadaa, mana ọ bụrụ na i nwee ụdị ụfụ a na-akụkụ afọ gị, biko gaa mee nnyocha.
Nsọ nwaanyị
Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-enwekarị afọ mgbu ma ha nọrọ na nsọ.
Onweghị ihe ọbụla ndị ọkacha mara chọpụtara na-akpata nke a.
Ọ bụ etu chi si kee onye. Mana afọ mgbu a na-akwụsị ma nsọ nwaanyị dị otu a gafechaa.
Ihe gbasara afọ ime
Dkt Anigbamkpu kwuru na afọ ime ekwesịghị igbu nwaanyị mgbu.
Mana nke a nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe niile amachaghị kwụrụ.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na nwa anọghị n'ime akpanwa dịka o kwesịrị, ọ ga na-egbu nwaanyị mgbu."
Nke a ka a na-akpọ 'ectopic pregnancy' na Bekee.
Ọzọkwa bụ ma nwaanyị dị ime nwee ọrịa aji-enyi maọbụ ogbeke maọbụ akpụ ime afọ nke Bekee kpọrọ 'Fibroid', o nwere ike ibute afọ ịfụ ịfụ.
Ndị ọzọ
Agụụ bụ otu ihe kacha ebute afọ mgbu. Ya mere, tupu ị chọwa ọgwụ afọ mgbu, irikwaala nri?
Ọzọkwa bụ ajọ mmiri ọṅụṅụ nwere ike ime ka nje baa mmadụ n'afọ.
Bekee na-akpọ ya 'parasites', mana ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọkarị ya 'worm'.
Nje ndị a na-akpata ọrịa dị icheiche nke afọ mgbu bụ otu n'ime ha.
Mana buru ụzọ gaa ụlọọgwụ ka e mee gị nnyocha ma gwa gị ọgwụ ị ga-aṅụ iji nweta onwe gị.
Dkt Anigbamkpu kwukwara na ọ dịghị njọ mmadụ ịṅụ ọgwụ 'worm' ihe dịka ọnwa isii ọbụla, ma ọ bụrụ na onye ahụ bi n'okirikiri ebe mmiri ọṅụṅụ adịghị ọcha.
Ihe nkiri ga-amasị gị: