Headache Symptoms: Ị ma na isi na-awa gị nwere ihe ọ na-atụ aka?

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Mgbakasị ahụ bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-agabiga kwa ụbọchị ọ kachasị ndị okenye.

Nke a na-ebutekarị ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa maọbụ ahụ ọkụ n'ahụ ndị mmadụ.

Mana ọ bụghị isi ọwụwa ọbụla ka ekwesiri ịṅụrụ "Paracetamol" dịka dọkịta Zubair Abdullahi gwara BBC Igbo.

Ọ kọwara na isi ọwụwa dị n'ụdị abụọ nke bụ: isi ọwụwa pramarị na isi ọwụwa sekọndrị.

Ihe dị iche n'isi ọwụwa abụọ ndị a

Isi ọwụwa pramarị

Anaghị amacha ama ihe na-ebute ụdịrị isi ọwụwa a.

Ọ bụ ebe a ka pasentị iri itoolu n'isi ọwụwa niile na-awa mmadụ banyere.

Ọ dịkwa ụzọ anọ nke Bekee kpọrọ:

  • Isi ọwụwa 'Tension'
  • Isi ọwụwa Cluster
  • Isi ọwụwa Migraine

Isi ọwụwa sekọndrị

Nke a na-esikarị n'ihe dị ka arahụghị ụra ọfụma nakwa aṅụghị mmiri ọfụma.

O kwukwara na ọrịa mkpọnwụ ahụ ma ọrịa ọbara mgbali elu nwereike ị butekwa isi ọwụwa nke a.

O kpuchiri sọsọ pasentị iri n'isi ọwụwa niile na-awa mmadụ.

Ọrịa ndị a nwereike ịgosipụta dịka isi ọwụwa:

  • Maleria
  • Tyfọd
  • Glaucoma (ọrịa mkpụrụ anya)
  • Meningitis
  • Encephalitis
  • Ọrịa ụbụrụ
  • Azụzụ.

Ihe ị ga-eme i gbochi maọbụ kwụsị isi ọwụwa

Dọkịta Abdullahi kwuru na ọ dị mma iri nri ga-enye ihe ọma n'ahụ dịka akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi na mmiri ọṅụṅụ.

O kwukwara na ezumike na ihi ụra ọfụma dị oke mkpa iji hụ na isi ọwụwa na ihe mmekpa ahụ belatara.

Ọ sị "Ọ bụrụ na ị na-enwekarị isi ọwụwa ọ ga-abara gị uru ma ị detuo mgbe o ji eme gị na oge o ji aka njọ tupu ị ga hụ dọkịta gị"

"O nwekwa ọgwụ ọbụla ị na-aṅụ gosi ya dọkịta na-agwọ gị ka ị nweike nata ọgwụgwọ zuru oke" ka dọkịta Abdullahi kwuru.

Ihe onyonyo ga-amasị gị