Anti malarials abuse : 71% ndị Naijiria-aṅụ ọgwụ ịba enweghị ịba

Ọtụtụ ndị mmadụ rịawa ọrịa na Naijiria, ha agbara ga zụọ ọgwụ ịba, mana mmadụ ole n'ime ha nwere ọrịa ịba n'ezie?

Nchọpụta ọhụrụ nke edepụtara n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na imerime ndị na-aṅụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha ṅụọ enweghi ọrịa ịba n'ahụ ha ma ncha.

Onyendu ndị mere nchọpụta a bụ Oche Joseph Otorkpa bụ onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ahụike ọha na Naijiria.

Otorkpa na ndị otu ya nyochara mmadụ 470 bụ ndị gara zụrụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha zụọ, wee chọpụta na `336 n'ime ha enweghi 'Plasmodium falciparum

antigen' n'ọbara ha bụ nje na-ebute ọrịa iba.

'Plasmodium falciparum' bụ nje kacha akpata ọrịa ịba na Naijiria nakwa Afrịka, ebe 'antigen' bụ ihe ga-adị n'ọbara mmadụ nke ga-egosi na mmadụ ariabuola ịba.

Nchọpụta ahụ kwuru na mmadụ iji aka enye onwe ya ọgwụ (self medication) jọgburu onwe ya maka na ọ na-eme ka mmadụ na-agwọ ọzọ, ebe ọzọ na-aria ya.

BBC Igbo kpọtụụrụ Dọkita Theresa Nwachukwu, onye ọkachamara na ihe gbasara ahụike ọha, o wee kọwaa na nchọpụta ahụ dabara n'anya ya.

Nwachukwu kwuru na otu ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organisation' adọọla aka na ntị ka a ghara inye maọbụ gbaa mmadụ ọgwụ ịba ma ọ bụrụ na-ebughi ụzọ nyochaa onye ahụ ma chọpụta na o nwere ịba n'ezie.

O kwuru na "mmadụ iṅụ ọgwụ na-abụghị nke orịa na-aria ya ga-eme ka ọgwụ ahụ ghara ịdịzi ire mgbe onye ahụ ga-ariawa ya bụ ọrịa n'ezie."

"Ọ dị mma na mmadụ ga-ebu ụzọ gaa nyocha ma chọpụta ihe na-eme ya tupu ọ ṅụwa ọgwụ."

Dkta Otorkpa na ndị otu ya tụpụtara alo wee rịọ gọọmentị etiti ka ha mee ka ụlọinyeọgwụ (pharmacy) niile nwee nke a kpọrọ (Rapid Diagnostic Kits) nke ha ga-eji na-enyocha ndị mmadụ tupu e nye ha ọgwụ ịba.

Nchọpụta edere n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na mmadụ dị pasentị iri asaa na otu na-aṅụ ọgwụịba enweghi ịba n'ezie.

Akụkọ ga-amasị gị: