You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Klint Da Drunk: E nweta Biafra, ọ ga-adị mma
Maazị Afamefuna Klint Igwemba eji 'Klint da Drunk' mara bịara sonyere BBC Igbo n'atụmatụ mkparịtaụka a kpọrọ "Gịnị na-afịọ" nke abalị ise nke ọnwa Julaị.
Igwemba tinyere ọnụ n'ihe banyere Biafra, ebe ọ sị na atụmatụ Igbo-enwe-eze nwereike ibute nsogbu ma e nwete Biafra - ma sịkwa na ihe a bu ihe ga adị mma "maka nwereonwe."
Ọ sị na ọ ga-adị mma ma Igbo nweta Biafra.
Mana ọ rụtụrụ aka na e nwetachaa Biafra, ọ bụrụ sọ Ndigbo ebe ahụ ka ndị kwe na ndị ekweghị ka ejuputa.
Klint da Drunk gwakwara BBC Igbo na ọ bụ egwu ka ya chọrọ ịgụ mana otu ụbọchi ọ gara ịgụ egwu e were si ya nye mmadụ abụọ bịara ọhụrụ ka ha gụọ egwu.
Ọ sịrị na "Dịka onye na-achọ ọganihu ndị mmadụ, m sị ha gaa n'ihu. Ka ndị mepee ọnụ nsogbu dị.
"Ụbọchi ahụ ka m sị na agaghị m agụ egwu ọzọ. Ndị a bụ ndị e ji 2face na Blackface mara ugbua."
Igwemba sị na ya lelechara anya cheta onye na-akpa ọchị ọ ma mgbe ọ na-eto a na-akpọ "Scatta Moojo" wee banye ime ihe ọchị.
Gee ihe o kwuru n'uju n'elu: